Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Nhụchatụ

Ị̀ Na-anụ́ Ihe M Na-anụ
Ka nwa atụrụ ahụ jụrụ nwata-nwoke ahụ n'azụ atụrụ
Ị̀ na-anụ́ ihe m na-anụ?
Ụzụ̀ n'atụ na mbara igwe, nwata-nwoke n'azụ atụrụ
Ị̀ na-anụ́ ihe m na-anụ?
Ihe karịrị afọ 2000 gara aga, a mụrụ Onye-nzọpụta nke ụwa. Ị̀ kwụsịtụla chetu echiche ka ndị mmadụ si mara gbasara ọmụmụ Ya? Abụ bụ́ “Ị̀ Na-anụ Ihe M Na-anụ?” na-enye anyị ihe atụ ka akụkọ ọmụmụ Ya si gbasaa.
Abụ ahụ malitere site na Mmụọ Nsọ ijụ nwa atụrụ ahụ, "Ị̀ na-ahụ ihe M na-ahụ?" Nwa Atụrụ ahụ wee gakwuru onye ọzụzụ atụrụ ahụ wee jụọ ya si, “Ị̀ na-anụ́ ihe m na-anụ?” Onye ọzụzụ atụrụ ahụ wee gakwuru Eze ozugbo jụọ ya si, “Ị̀ ma ihe m maara?” Mgbe ha kesara ihe Chineke gwara ha, otu mba niile nụrụ banyere ọmụmụ Onye Nzọpụta, bụ Jizọs, na ihe ọmụmụ Ya pụtara nye ụwa dum.
Ka m gwa gị nnukwu ozi dịnụ: nke a bụkwa ọkpụkpọ-òkù anyị dị ka ndị n'eso ụzọ Kraịst - ịkọrọ ndị ọzọ ihe a gwaworo anyị! Chineke na-ekpughe Onwe-Ya nye anyị niile n'ụzọ dị iche iche, dabere n'ụdị mmadụ anyị bụ̀ na onyinye anyị gasị. Nye ụfọdụ, Ọ na-egosi anyị ihe ndị ana ahụ anya gbasara Onwe-Ya, dị ka kpakpando dị na mbara igwe. Ndị ọzọ nwere ike ịbịaru Ya nso n'ụzọ kacha mma nye ha site n'ịgụ Akwụkwọ Nsọ, ụfọdụ site n'ịbụ abụ otuto nye Ya. Ajụjụ dị nụ bụ gịnị ka anyị ji ihe Chineke n'enye anyị eme? Anyị kwesịrị ịghọta na Chineke ga-eji ihe O kpugheere anyị n’otu n’otu mee ka ndị mmadụ bịaruo Ya nso.
N’abụ a, Chineke họọrọ olu onye ọzụzụ-atụrụ ka ọ gwa ndị ọzọ ihe ọ nụrụ, n’ihi ya, mba dum nụrụ banyere ọmụmụ Jizọs. Gịnị ka anyị ga-emenwú ụbọchị taa? Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ndị mmadụ mata banyere Onye-nzọpụta nke a mụrụ, anyị kwesịrị iwepụta oge iji kọsara ndị ọzọ ihe Ọ na-ekpughere anyị. Ndụ gasị na-agbanwe mgbe anyị na-agwa ndị mmadụ dị na ndụ anyị ihe Chineke gosịrị anyị na meere anyị.
Ajụjụ Gasị:
Gịnị ka Chineke gosiworo ma ọ bụ gwa gị n’oge na-adịbeghị anya i kwesịrị ikerịtara ndị ọzọ?
N’ụzọ dị aṅaa ka Chineke si ekpughe Onwe-Ya nye gị?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church