Abụ-Gasị Nke Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Nke EkeresimesiIhe Nhụchatụ

Ding Dong! Aṅụrị Ká Aṅụrị N'eme N'elu
Ding dong! Aṅụrị ká aṅụrị n'eme n'elu
N'eluigwe, mgbịrịgba na-ada:
Ding dong! N'ezie mbara ígwé
Jupụtara na-abụ Ndị Mmụọ Ozi.
Ọ dị ka anyị nwere ọtụtụ mgbịrịgba na mkpọtụ na otiti-mkpu n'emenụ na ndụ anyị. Ma ọ bụ̀ na maikrowevụ n'eme ka anyị mata na anụ ọkụkọ "esiri ofuma n'ụlọ" anụọla ọkụ nke ọma maka oriri, ma ọ bụ̀ na ụgbọala anyị n'eme mkpọtụ n'agwa anyị na eriri-oche anyị anọghị ọnọdụ o kwesịrị ịnọ, ma ọ bụ̀ na oké mkpọtụ ahụ bụ́ "Aaaeee! Aaaee! Aaaee!" n'akpasu nnukwu iwe nke sitere n'ihe n'akpọlite anyị n'ụra n'eme ka anyị si na ute ụra anyị malite maka ụbọchị; mkpọtụ na mkpu gasị gbara ndụ anyị gburugburu. Mkpọtụ ndị a nwere ike ịpụta ọtụtụ ihe dị iche iche.
Site na egwú Ekeresimesi a ama-ama na nke mara mma, e seerè anyị foto nke mgbịrịgba ememe aṅụrị n'akụ́ n'eluigwe. Ọ dị nnọọ ka onye dere egwú a ọ na-akọwa ka anyị pụrụ isi nụ ọkpụkpọ-òkù sitere n'eluigwe. N’ọtụtụ ebe dị iche iche n'Akwụkwọ Nsọ, Okwu Chineke na-akọwa otú mmadụ si nụ ihe n’ọnụ Chineke. Mgbe ụfọdụ, ọ bụ ụda na-ada ka égbè eluigwe mana n'ebe ndị ọzọ ọ bụ nwa olu, n'ada nrọ nrọ.
Ị̀ nụtụla nwa olu ahụ n'atakwunyere gị ihe ma ọ bụ n'akpọ gị òkù n'ụzọ dị nrọ dị ka Ịlaịja nụrụ na 1 Ndị Eze 19:12? Chineke nwere ike ịkpọ anyị òkù n'ụzọ dị iche iche. Mana ihe Ọ na-akpọ onye ọ bụla n’ime anyị ime, pụrụ iche. O nwere ike na-akpọ gị ka ị gaa leta ma kwusara enyi gị okwu ọma nke n'agabiga ihe isi ike n'oge ezumike. O nwere ike na-akpọ gị ka ị rụọ ọrụ ọhụrụ. Chineke nwere ike iji ndị dọkịta na-agwọ́ ndị n'enweghị ike ikwu ụgwọ ọrịa ha, jiri ndị n'arụ ihe wuo ụlọ akwụkwọ ná mba dara ogbenye, ma ọ bụ jiri onye n'ewepụ ahịhịa wepụsia ahịhịa nke dị n'ihu ụlọ otu nwaanyị merela agadi di ya nwụrụ. Ihe ọ bụla onyinye-si-na-chi gị nwere ike ịbụ, Chineke pụrụ iji ya gọzie ndị ọzọ. Ihe dị mkpa bụ ka i gee ntị n’olu Ya, dịka ọmarịcha mgbịrịgba ndị ahụ si n'eluigwe na-adà. Ọ na-akpọ gị ka ị bụrụ ìhè na ndụ mmadụ Ekeresimesi a.
Ya mere, gaa n'ihu wee kwụsịlatụ mkpu ahụ ngwá n'akpọte gị n'ụra n'eme ma hikwuo obere ụra, mana hụ na izara òkù Nna-Anyị Chineke na ndụ gị.
Ajụjụ Gasị:
Kedụ ka i siri nụ n'ọnụ Chineke n'oge gara aga?
Kedụ ihe Chineke na-akpọ gị ka ị meere onye ọzọ oge Ekeresimesi a?

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Chineke nọnyeere anyị - n'ime nkwa ndị a zara aza, ebumnobi gasị emezuru, na olileanya emere ka ha dị ọhụrụ. Olee otú anyị ga-esi gosipụta ọṅụ juru anyị obi ma ọ bụghị site n'ibụ̀ abụ. N'oge Ekeresimesi a, nyochaa egwú ndị amụrụ site n'ọṅụ anyị na Kraịst abatawo n'ụwa, ma chọpụta ọzọ mkpa ha dị na ndụ gị taa n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri abụọ na ise.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church