Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka ỤmụakaIhe Nhụchatụ

Ụbọchị Nke Iri Abụọ Na Atọ: Gụọ Ndị Filipaị 2:6-11
Lee ihe mara mma Chineke nyere anyị site n’ịbịa n’ụwa, were ọdịdị mmadụ, taa ahụhụ n’elu obe na nwụọ ka anyị na Ya nwee ike ibi ndụ ruo mgbe ebighị ebi! Ọ hụrụ gị n'anya nke ukwuu! Ị họrọla iso Ya? “Ọ bụ naanị n'aka Ya ka a pụrụ isi nweta Nzọpụta; n’ụwa nile ọ dịghị onye ọzọ Chineke nyere nke pụrụ ịzọpụta anyị” (Ọrụ Ndịozi 4:12 GNT).
Ihe Omume: Anyị nwere ọtụtụ ihe anyị ga-eji nye Jizọs ekele! Kpekọtanụ ekpere ọnụ ma kelee Ya maka ịzọpụta anyị! Anyị chọrọ icheta ihe Ekeresimesi bụ maka ya n'ezie, taa na kwa ụbọchị! Iji nyere ụmụ gị aka ime ka akụkọ banyere ọmụmụ Jizọs dịkwuo irè n'anya ha, webata ya n'oge egwuregwu ha site n'ime akụkọ banyere ọmụmụ Jizọs n'ụzọ ejijé.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ezigbo Nne, ọ na-adị gị ka oge Ekeresimesi ji ọsọ na ọgbaghara n'agabiga gị? Afọ a pụrụ ịdị iche. Ka gị na ụmụ gị chọpụta akụ nke ịhụnanya Kraịst n'Ekeresimesi a! Ụlọ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Emebere Maka Ụmụaka bụ ọmarịcha agụmagụ ihe òfùfè dị ụbọchị iri abụọ na ise, zuru ezù, nwere akwụkwọ ihe omume ịga ebipụta nke ga-enyere aka tụzie obi ụmụ gị n'ebe Onye-nwe-anyị nọ ma mee ka oge Ekeresimesi a bụrụ ihe bara uru nye gị!
More