Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Banye na NzubeIhe Nhụchatụ

Step into Purpose

ỤBỌCHỊ 3 NKE 5

Nzube E Mere Ka Ọ Dị Mfe

Echiche banyere “nzube” bụ ihe gbagwojuru m anya mgbe m na etolite n’Ụlọ Ụka.

Olee otú Chineke si chọọ iji m wee mee ihe? Kedu mgbe m ga-achọpụta? Gịnị ka m kwesịrị ina eme ruo mgbe ahụ? Ana m ajụkarị onwe m ajụjụ ndị a mana ha pụtara ihe efu na nkụda mmụọ.

Nke a bụ ọgụ na mgba kwa mgbe ruo otu ụbọchị m gafetara Ọkwu Chukwu nke gbanwere ndụ m n'eziokwu -“Ihe ọ bụla ị na-eme, mee ya ihe niile maka otuto nke Chineke.” (1Kọrint 10:31)

Nkpughe banyere.

Ee, Chineke akọwapụtala atụmatụ pụrụ iche maka onye ọ bụla n’ime anyị. Ee, nzube gị dị iche na nzube nke onye ọzọ. Mana ihe ndị a nile dị maka otu, nnukwu, mkpokọta na nzube ime mmụọ: iwetara Chineke otuto.

Chineke anaghị achọ nkwalite nke onwe Ya! Ọkpọku Ya ka e nye Ya otuto sitere n’oke ịhụnanya Ọ nwere n’ebe anyị nọ. Ọ maara na mgbe anyị ghọtara ịdị mma Ya wee nye Ya uru kwesiri Ya, anyị na-enweta mkpughe wee malite ịghọta ịhụnanya Ya n'ebe anyị nọ na ọkwa miri emi. Ịhụnanya a na-agbanwe ihe niile.

Chineke hụrụ anyị n’anya ma ànyị na-enye Ya otuto ma ọ bụ na anyị adịghị enye Ya otuto, ma ọdinaobi Ya bụ ka anyị mata n’uju ịhụnanya ahụ. Otuto nile diri Chineke! Nke a bụ nzube anyị.

Nke Hannah White dere

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Step into Purpose

Gịnị bụ̀ nzube m? Kedụ ihe m kwesịrị iji ndụ m mee? Gịnị bụ̀ atụmatụ Chineke maka m? Ihe ndị a niile bụ ajụjụ ọtụtụ n'ime anyị nà-ajụ n'otu oge ma ọ bụ ọzọ na ndụ anyị. Anyị bù n'obi ịza ụfọdụ ajụjụ ndị a kà anyị nà-atọ́ghasí ihe ịbanye ná nzube gị bụ̀. Soro ụmụ akwụkwọ ole na ole nke kọleji C3 ka ha n'ènyé ụfọdụ nkọwa n'isiokwu a.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele C3 Church Sydney Pty Ltd maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.c3college.com/