Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Banye na NzubeIhe Nhụchatụ

Step into Purpose

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

Rue Mgbe Ị Nweghị Ike Imetụ Ala Aka

Ọhụụ dị ezigbote oke mkpa maka ịbanye na nzube gị.

Izikel 47 na-ekwu maka osimiri nke si n’ụlọ nsọ na-asọpụta, sitere n’Ebe Nsọ Nke Ebe Nsọ (lee Aisaia 6:1–6). Isi Akwụkwọ Nsọ a dị ike n'ihi na ọ gosiri na ọ bụrụ na ị na-agbaso ịdị nsọ nke Chineke, enweghi obi abuo maka gi inweta ọhụụ banyere nzube Ọ nwere maka gị.

Ma, dị ka Isi akwụkwọ nsọ na-egosi, a naghị enweta nke a n'ime ebe odighi ihe obula n'esogbu gị.

Izikiel gafere ọkwa anọ dị iche iche tupu ya enwee ike ịnwete ọhụụ. Ọtụtụ mgbe, anyị na-arịọ Chineke ka Ọ kpughee nzube anyị, mana anyị anaghi adị njikere ịbanye n'ime ime. Ọhụụ Ezikiel hụrụ bụ nke ndụ bara ụba ejigidere site na ino nso ịdị nsọ nke Chineke (osimiri ahụ, lee Abụ Ọma 1:1-3). Ihe ndị kpafụrụ akpafu na abu ihe ndi kwusiri na-njedebe, burukwa ihe ndi na-enweghị ndụ (Izikel. 47:11).

Ọ bụrụ na ịchọrọ ndomanya na ọhụụ kwụsiri ike maka nzube gị, ịkwesịrị ibanye n'ime mmekọrịta gị na Chineke nke na-akwalite oke gị. Nke obu na ị mikpụrụ n'ime ya, ebe ụkwụ gị adịghị emetụ ala nke ebe ọ dighi ihe obula n'esogbu gi. Ọ bụ n'ime ebe a ka ị na-enyefe ike njikọta gị ma, n'ọnọdụ ya, hụ onwe gị ka Ọ bụụrụ gi n'ime nzube nke nwere njupụta nke ndụ.


Nke Candace Tossas dere

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Step into Purpose

Gịnị bụ̀ nzube m? Kedụ ihe m kwesịrị iji ndụ m mee? Gịnị bụ̀ atụmatụ Chineke maka m? Ihe ndị a niile bụ ajụjụ ọtụtụ n'ime anyị nà-ajụ n'otu oge ma ọ bụ ọzọ na ndụ anyị. Anyị bù n'obi ịza ụfọdụ ajụjụ ndị a kà anyị nà-atọ́ghasí ihe ịbanye ná nzube gị bụ̀. Soro ụmụ akwụkwọ ole na ole nke kọleji C3 ka ha n'ènyé ụfọdụ nkọwa n'isiokwu a.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele C3 Church Sydney Pty Ltd maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.c3college.com/