Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Banye na NzubeIhe Nhụchatụ

Step into Purpose

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

Nzube n'ime Nchere

Anyị bi n'ọgbọ ngwa ndakwa nri. Ihe niile ga-emerịrị ugbu a. Anyị enweghị ike ichere, ihe mpụta ga-abụrịrị ozugbo. Otu ahu ka odikwa ka anyi si ahu nzube anyị mgbe ụfọdụ.

Anyị nwere ike kwere na Chineke akpọwo anyị n'ihe - ka anyị dụọ puku kwuru puku mmadụ n'ofufe, ka anyị nwee azụmahịa na-eme nke ọma na irite ụgwọ ọnwa gbara akara isii, ịchọta ịhụnanya nke ndụ anyị na ịlụ di na nwunye, ịgagharị ụwa na-ekwụsa ozi ọma.... ndepụta na-aga n'ihu. O nweghị ihe dị njọ na ikwere na ihe ndị a ga-abia na mmezu. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe, ọ na-ewe oge na nchere ka anyị ruo ebe ahụ!

Atụrụ ya na David dị naanị ihe dị ka afọ iri na ise mgbe Samuel tere ya mmanụ ka ọ ghọ eze nke Izrel, ma David ewereghi ọkwa ahu tụpụ ya adi afọ iri ato (2 Samuel 5:4)! N’afọ ndị ahụ nke nchi che, Chineke kwadọrọ Devid ka ọ bụrụ eze. Ọ bụ n’ime ọzara ka Devid mụtara ụfọdụ n’ime ihe ndị kasị baa uru ná ndụ ya, ebe ihe niile ọ pụrụ ịdabere na ya bụ Chineke.

Ịmụ Abụ Ọma na-enye anyị mkpughe n’ime obi mgbọwa Devid gabigara, anya mmiri ọ wụsara, ma ọ mụtakwara maka ikwesị ntụkwasị obi nke Chineke, maka oké ịhụnanya Ya na otú Devid siri nweta ume na ebe mgbaba n’ime Ya. Gụọ Abụ Ọma Isi Nke Iri Abuo na Ise. Ịgabiga oge ndị a kpụrụ Devid ka ọ ghọọ nwoke ukwu na-atụ egwu Chineke nke Chineke họpụtara ka ọ bụrụ eze Izrel.

Dị ka Devid, nchere bụ oge ihe nwere ike ọ gaghị adị mfe, mana ọ bụ oge Chineke na-akwado anyị maka ihe niile dị n'ihu ka anyị na-abanye n'ime ihe niile Ọ nwere maka anyị! Nwee obisike na Chineke na-eso gị ka ị na-azọbanye ụkwụ n'ime nnukwu ihe ndị Ọ debere maka gị.


Ọ bụ Joshua Sijl dere ya

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Step into Purpose

Gịnị bụ̀ nzube m? Kedụ ihe m kwesịrị iji ndụ m mee? Gịnị bụ̀ atụmatụ Chineke maka m? Ihe ndị a niile bụ ajụjụ ọtụtụ n'ime anyị nà-ajụ n'otu oge ma ọ bụ ọzọ na ndụ anyị. Anyị bù n'obi ịza ụfọdụ ajụjụ ndị a kà anyị nà-atọ́ghasí ihe ịbanye ná nzube gị bụ̀. Soro ụmụ akwụkwọ ole na ole nke kọleji C3 ka ha n'ènyé ụfọdụ nkọwa n'isiokwu a.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele C3 Church Sydney Pty Ltd maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.c3college.com/