Nyè Ọrụ Gị Uru Ziri EziIhe Nhụchatụ

Chineke Na-eji Ọrụ Anyị N'arụ Wee Mee Nzube Ya
Mgbe ọtụtụ afọ nke ọnwụnwa gasịrị, nrọ Josef ahụ mezurù. Ọ bughi naanị na Fero nyeferè n'aka Josef ihe nile gbasara Ijipt, umu-nna-ya bịakwuterè ya ichọ nri mgbe oké ụkọ nri ahu merè wee kpọọ isi n'ala nye ya, n'amaghị ozugbo na ọ bụ ya. Ọ bụ uche Chineke kemgbe iwerè afọ asaa nke ụba nri ahụ na afọ asaa nke oké ụkọ nri ahụ dugaa ndị Ya n'Ijipt ebe ha ga-agbaba zere ọnwụ. Chineke ji ọnọdụ ndị ahụ niile mere Josef kwado ya ka atụmatụ Ya bịa na mmezù.
Mgbe Jekọb nwụrụ, ụjọ tụrụ ụmụnna Josef na ọ ga-arụghachí ha ala ha rụrụ ya. Mana Josef lekwasịrị anya n’ebumnobi Chineke wee zaghachi ha sí, “Unu zubere imerụ m ahụ́, ma Chineke tụgharịrị ya ka ọ bụrụ ezi ihe [...] ịzọpụta ọtụtụ ndụ” (Jenesis 50:20). Josef hụrụ naanị ntakiri akụkụ otú o siri daba na atụmatụ ka ukwuu nke Chineke nwerè, nke anyị onwe anyị n'ahuwanyé ụbọchị taa. Otu ụbọchị, Josef ga-ahụ nnọọ ndụ nde kwa nde o tinyerè aka wee zọpụta.
Jems 1:2-3 na-agwa anyị, sị: “Unu na-agụnụ ya na ọ bụ ihe ọñụ, ụmụnne m na ụmụnna m, mgbe ọ bụla ụdị ọnwụnwa dị iche iche cherè unu ihu, n’ihi na unu maarà na ule nke okwukwe unu na-arụpụta ntachi obi.” Mgbe anyị na-adị nkwesị-ntụkwasị-obi n'ihe isi ike, anyị na-emeghe ụzọ maka Chineke ime ihe dị ịtụnanya site n'aka anyị. Ọ dị mkpa ịtụkwasị obi na Chineke dị ike na Ọ ga-eji ọrụ anyị n'arụ wulite àgwà anyị, wusie anyị ike, na rụpụta n'ikpeazụ nsonaazụ n'apụghị isite na anyị ma e wezụga aka Ya na ọrụ Ya n'ime ndụ anyị.
Mgbe anyị nọgidere na-elekwasị Kraịst anya, anyị pụrụ inwe obi ike na Chineke na-eji ọrụ anyị eme ihe n’ụzọ ka ukwuu karịa ka anyị pụrụ ichetụ n’echiche. Anyị pụrụ ọbụna ịhụtụ́ otú Chineke si eji ọrụ anyị eme ihe n’ụzọ ka ukwuu, dị ka Josef merè. Otu ụbọchị, anyị niile ga-ahụ akụkụ nke ikwesị ntụkwasị obi anyị rụrụ n'ọrụ e keerè anyị rụọ, na atụmatụ Chineke.
Na-ama onwe gị aka ikwe ka Chineke nụchaa gị site n’ọnọdụ ndị tara akpụ, ma bulie uru ihe ọrụ gị pụtara maka nzube Ya na otuto Ya.
Ekpere
Nna m Chineke, ama m na Ị na-arụ ọrụ mgbe niile n'ime na site na ndụ m. Nyere m aka ịna ahuta kwa ụbọchị, ka ọrụ m n'arụ si dị uru ebighị ebi. Mee ka okwukwe m bawanye. Nye m amamihe n'ọrụ m n'arụ ka ihe niile m na-eme wee bụrụ nke Ị pụrụ iji mee ihe maka nzube Gị. N'aha Jizọs. Amen.
Maka Nyocha Ndị Ọzọ
Lee anya na ihe òfùfè gasị gbasara ebe ọrụ si na Workmatters.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọtụtụ n'ime anyị ga-eji ihe gafere ọkara ndụ nke ntorobịa anyị n'arụ ọrụ. Anyị chọrọ ima na o nwerè ihe ọrụ anyị n'arụ pụtara — na ọrụ anyị n'arụ bara uru. Mana nrụgide, ihe gasị a chọrọ ka anyị mee, na ihe mgberede nwere ike ime ka anyị hụ ọrụ dịka ihe siri ike — ihe anyị n'agaghị eji obi anyị niile wee mee. Atụmatụ ihe ọgụgụ a gà-enyere gị aka imata ike i nwerè ịhọrọ uru ziri ezi maka ọrụ gị dị mgbọrọgwụ na okwukwe.
More