Nyè Ọrụ Gị Uru Ziri EziIhe Nhụchatụ

Ịdaberè Na Chineke N'ọrụ Gị Mgbe Niile
Onye anyị ji maka ya na-arụ ọrụ dị mkpa ma n'egosipụta uru anyị n'etinye n'ọrụ ahụ anyị n'arụ. Ọ bụrụ na anyị na-akwanyere ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ ùgwù ma na-enwe mmasị n’ụlọ ọrụ anyị, o yìkarịrị n'anyị ga-achọ iji ike anyị niile rụọ ọrụ. Mana mgbe e mejọrọ anyị, ma ọ bụ anyị na ndị anyị na ha n'arukọ ọrụ enwee nsogbu n'ọrụ, ọ dị mfe anyị inwe nkụda mmụọ, ike ọgwụgwụ na ọbụna iwe obi. Ka anyị si debe ndị mmadụ n'ime obi anyị nwere ike inwe mmetụta-ọjọọ ná mkpali anyị ịrụ ọrụ anyị n'ụzọ kachasị mma.
Josef nwerè ikike niile iwe iwe na ịdị obi ilu. A tụbara ya n’ụlọ mkpọrọ n’ihi ihe ọ na-emeghị. N'agbanyeghị nke ahụ, Josef nọgidere na-adabere na Chineke ma jeere onye na-elekọta ndị mkpọrọ ozi nke ọma. N’ihi ya, enyere ya ọkwa onye na-elekọta ndị mkpọrọ niile. Mgbe onye ome-achịcha eze na onye obu-ihe ọṅụṅụ eze, bụ́ ndi atụbarà n'ụlọ mkpọrọ ahụ, nwere obi mgbaru, Josef gosiri ha obi ọmịiko. O gere ntị n'akụkọ nrọ ha gbagwojuru ha anya, wee nye ha nkọwa Chineke gosiri ya. Obiọma ya mere ka obu-ihe ọṅụṅụ ahụ gwa Fero banyere ya mgbe Fero rọro nrọ gbagwojuru ya anya nke na ọdịghị onye pụrụ ịkọwara ya hụ. N'agbanyeghị nke ahụ, Josef agbalịghị ime onwe ya ka o jupụtara n'amamihe. Ọ gwara Fero na ọ dịghị onye pụrụ ịkọwa nrọ ya ma e wezụga Chineke. O wee nyezie nkọwa Chineke nyerè ya.
N’ihi na Josef dị na gosipụta nkwesị-ntụkwasị-obi n’ụlọ mkpọrọ, Chineke merè ya onye-isi ala Ijipt nile (Luk 16:10). Chineke nọnyeere Josef oge niile, na-akwado ya, na-enye ya amamihe, ma n'ahazi ọnọdụ niile iji mezuo nzube Ya maka ya.
Ọ bụrụ na omume nke ndị ọzọ na-emetụta mkpali anyị n'enwe n'iru ọrụ anyị ofuma, igba mbọ anyị n'ịrụsi ọrụ anyị ike agaghị akwụ chịm. Ma gịnị ka ọ ga-apụta ma ọ bụrụ n'anyị n'adabere na Chineke mgbe niile n'ọrụ anyị n'arụ? Ịrụ ọrụ anyị maka Chineke na-enye anyị ike ịrụpụta ihe dị oké mma mgbe niile. Kedụ otù ị ga-esi mee ka ntụkwasị obi gị na Chineke dịkwuo elu n'ọrụ gị ụbọchị taa?
Ekpere
Nna, gbaghara m maka oge m na-ekwe ka otú m si deberé ndị ọzọ obi metụta àgwà m n'ebe ọrụ m dị. Mee ka okwukwe m dịkwuo elu ka Ị ji ọrụ niile m na-arụ n'ewetere Gị nsọpụrụ n'ụzọ mara mma. Na-arụ ọrụ n'ime obi m ka m nwee ike ịnọgide n'enwe àgwà ziri ezi. N'aha Jizọs. Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọtụtụ n'ime anyị ga-eji ihe gafere ọkara ndụ nke ntorobịa anyị n'arụ ọrụ. Anyị chọrọ ima na o nwerè ihe ọrụ anyị n'arụ pụtara — na ọrụ anyị n'arụ bara uru. Mana nrụgide, ihe gasị a chọrọ ka anyị mee, na ihe mgberede nwere ike ime ka anyị hụ ọrụ dịka ihe siri ike — ihe anyị n'agaghị eji obi anyị niile wee mee. Atụmatụ ihe ọgụgụ a gà-enyere gị aka imata ike i nwerè ịhọrọ uru ziri ezi maka ọrụ gị dị mgbọrọgwụ na okwukwe.
More