Nyè Ọrụ Gị Uru Ziri EziIhe Nhụchatụ

Ịhọrọ̀ Uru Nke Chineke Banyere Ọrụ
Ọtụtụ mgbe, Ndị Kraịst na-enwe echiche n'ezighị ezi na nanị ọrụ dị Chineke mkpa bụ ọrụ nke ndị pastọ, ndị n'ezi ozi Kraịst n'ala ọzọ, na ndị ọrụ inye-aka. Ihe mmebi dị n'echiche a bụ na anyị na-ekpebi na ọrụ ndị ọzọ abaghị uru, nke nwere ike inwe mmetụta-ọjọọ na àgwà na mkpali obi n'adịghị mma n'ebe ọrụ ndị ọzọ dị. Nke bụ́ eziokwu bụ na, ọrụ niile dị Chineke mkpa. Chineke chọrọ ka anyị na Ya na-arụkọ ọrụ n’ọrụ ọ bụla anyị na-arụ iji jeere ndị ọzọ ozi na imezu nzube Ya.
Josef ghọtara nke a, ọbụna n’ọnwụnwa ya kasị ukwuu. Josef akpaghị àgwà ọjọọ, ọbụna mgbe ọnọdụ ya sì na njọ baa n'oké njọ. Ọ rugidere ọrụ ya ofuma n'agbanyeghị na o doro anya na ọrụ ọ n'arụ abụghị ọkpụkpọ ya ma ọlị. Josef maarà onye ọ na-arụrụ ọrụ n’ezie — Chineke. N’ihi ya, Jenesis 39 na-agwa anyị na “Onye-nwe-anyị nọnyeere Josef” ugboro anọ(Jen 39:2, 3, 21, 23). Mgbe nwunye Pọtịfa nọ na-abịakwute Josef, ọ sịrị: “Onyenwe m enweghị nchegbu banyere ihe ọ bụla n’ụlọ a. [...] Olee otú m ga-esi ... mehie megide Chineke?” Josef ghọtara na ihe ịga nke ọma ya siterè n’aka Chineke, ọ dịkwa mkpa ka ọ sọpụrụ Chineke atụghị egwù.
N’agbanyeghị na Josef họọrọ ime ihe ziri ezi, e boro ya ebubo na-ezighị ezi, chụọ ya n’ọrụ ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ. Ọbụna n’etiti ọnọdụ na-ezighị ezi, Josef akwụsịghị ịsọpụrụ Chineke na ijere ndị nọ ya gburugburu ozi. Ọzọkwa, Chineke nyerè ya ihu ọma n'ebe onye nlekọta ụlọ mkpọrọ nọ.
Anyị ga-agabiga ahụmahụ ọnọdụ na-ezighị ezi n’ebe anyị n'arụ ọrụ, dị ka Josef gabigarà. Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịna-akpa àgwà na-adịghị mma n’ebe ọrụ anyị nọ mgbe ihe na-adịghị mma. Jizọs gwara anyị: “N’ụwa a, unu ga-enwe nsogbu. Mà sie nụ̀ ike n'obi! Emeriwo M ụwa” (Jọn 16:33). Anyị kwesịrị ịdị na-anọgide na Kraịst n'ọnọdụ nile, ka ọrụ anyị na-arụ mịa ọtụtụ mkpụrụ (Jọn 15:5).
Ụbọchị taa, gịnị ka ị ga-eme ka ị hụ ọrụ gị otú Chineke si ahụ ya?
Ekpere
Chineke Nna daalụ maka ọrụ Ị nyeworo m. Daalụ maka inye m ihe ịga nke ọma. Nyere m aka ka m nọrọ n’ime Gị mgbe niile ka m wee nwee ike ijere ndị ọzọ ozi nke ọma n’ọnọdụ niile, ọbụlagodi mgbe ihe anaghị aga ka m si tụọ ma ọ bụ chee. Nyere m aka ka m lekwasị anya na Jizọs. N'aha Jizọs. Amen.
Maka Nyocha Ihe Ndị Ọzọ
Chọpụta otu esi achọ nzube Chineke maka ọrụ. Lelee vidiyo a nke Bonnie Wurzbacher, Onye bụbu SVP, n'ụlọ ọrụ Coca-Cola.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọtụtụ n'ime anyị ga-eji ihe gafere ọkara ndụ nke ntorobịa anyị n'arụ ọrụ. Anyị chọrọ ima na o nwerè ihe ọrụ anyị n'arụ pụtara — na ọrụ anyị n'arụ bara uru. Mana nrụgide, ihe gasị a chọrọ ka anyị mee, na ihe mgberede nwere ike ime ka anyị hụ ọrụ dịka ihe siri ike — ihe anyị n'agaghị eji obi anyị niile wee mee. Atụmatụ ihe ọgụgụ a gà-enyere gị aka imata ike i nwerè ịhọrọ uru ziri ezi maka ọrụ gị dị mgbọrọgwụ na okwukwe.
More