Ụkpụrụ nchịkwa oge sitere n'Okwu ChinekeIhe Nhụchatụ

Kwuo Mba N'Ezoghị Ọnụ
Ka Mak na-emepe ihe ndekọ ya banyere ozi Jizọs, ọ na-akọwa Onye-Nzọpụta-Anyị dị ka Onye n'agwọ ndị mmadụ ma n'elu ma n'ala, chụpụrụ mmụọ ọjọọ ndị nọ n’ime otu nwoke nọ n’ụlọ nzukọ ma gwọọ nne nwunye Pita n’ụlọ ya dị na Kapaniọm. N’uhuruchi nke ụbọchị ahụ, “ndị mmadụ kpọtakwaara Jizọs ndị niile na-arịa ọrịa na ndị mmụọ ọjọọ ji. Obodo ahụ dum gbakọtara n’ọnụ ụzọ ụlọ ebe Ọ nọ, Jizọs wee gwọọ ọtụtụ mmadụ.”
N'ụzọ n'atughị n'anya, ụtụtụ echi ya ụmụ azụ Jizọs gbarala ọsọ bịakwute Ya wee sị, “Onye ọ bụla n'achọ Gi!” N'ezie ndị obodo ahụ enwetala nte akụkọ banyere ike ọrụ ebube nke Jizọs iji gwọọ nrianria ma ọ bụ chụpụ ajọ mmụọ ha wee chọọ ka Ọ mee ya ọzọ n'ụbọchị nke abụọ. Mana Jizọs sịrị mba. Ikekwe n'ụzọ ndị na-eso ụzọ Ya esighị chee ma ọlị, Jizọs sịrị: “Ka anyị gaa n’obodo nta ndị dị nso ka M wee kwusaakwa ozi ọma n’ebe ahụ. N’ihi nke a ka M ji wee bịa.”
Nke a bụ nke mbụ, ma n’ezie, ọ bụghị oge ikpeazụ anyị nụrụ ka Jizọs na-ekwu “mba” n’ozi ọma. Gịnị mere Jizọs jiri sị “Mba”? O pụtara ìhè na Ọ nwere ike ịgwọ ọtụtụ ndị mmadụ. O bụ ezie na Ọ nwere mmasị ibelata ihe mgbu dị n'ndụ ndị a. Ma n’agbanyeghị na Jizọs nwere mmasị sịrị ike ịgwọ ọtụtụ mmadụ, Ọ maara na Ọ nwere oge dị nta n’ụwa iji mezuo “nzube” Ya. Jizọs abịaghị n’ụwa naanị ka Ọ gwọọ ndị mmadụ na ikpughe onye Ọ bụ. Ọ bịara ikwusa ozi ọma na ikwadebe maka oke ịchụàjà Ọ ga-eme n'obe. Ọ doro Jizọs anya maka nzube Ya, nke a mere ka Ọ si mba nye ihe ọma ka Ọ wee nwee ike ilekwasị anya n'ihe dị mkpa Ọ bịara n'ụwa ime.
Ọ bụrụ na Jizọs enweghị ike ịsị ee nye ihe niile, anyị apụghịkwa ịsị otu ahụ. Mụ na gị nwere obere oge na akụrụngwa n'ejughị ebe niile. Iji jiri oge anyị nwere rụpụta ihe bara uru, ọ dị oke mkpa na ọ ga-edo anyị anya nke ukwuu ihe anyị kwenyere na Chineke kpọrọ anyị ka anyị mee ma nwee omume nke ịsị mba nye ọtụtụ ihe—ọbụna ndị dị mma n'ezie —na-adọpụ uche anyị n'ebe ozi anyị dị mkpa nọ.
Ya dị gị n'uche, e nwere ebumnobi ị ji dị ndụ! A na m ekpe ekpere na Akwụkwọ Nsọ anyị nyochara n'ime ụbọchị isii gara aga ga-ama anyị aka ka anyị mara ihe banyere otu anyị si eji oge anyị nwere n'ụwa a eme ihe, jiri oge nke ikpeazụ anyị hụ Chineke n'anya, hụ ndị ọzọ n'anya, na mete ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst site na ndụ anyị na ọrụ anyị.
Ọ bụrụ na usoro ọgụgụ a tọrọ gị ụtọ, ihe ọgụgụ ofufe m na-eme kwa izu ga-amasịkwa gị, na-enyere gị aka n'ụzọ dị ukwuu ijikọ ozi ọma na ọrụ gị. Debanye aha gị ebe a.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Obi ọ n'ahikpọ́ gị nà enweghị ihe karịrị awa iri abụọ na anọ n'otu ụbọchị? Ihe ndị idepụ̀tajụrụ̀ ime ha n'enye gị nsogbu? Ike ịdị ike ọgwụgwụ ọ gwụla gị n'ihi na ịnweghị oge ịgụ Okwu Chineke na gị na ezinụlọ gị, na ndị enyi gị ịnọkọ? Ihe ndị a nwerè ike ịbụ nsogbu ndị ana ahụkarị n'ụwa. Oziọma dịnụ bụ̀ na Akwụkwọ Nsọ n'enye ụkpụrụ gasị doro anya maka anyị ijikwa oge anyị nke ọma. Atụmatụ ihe ọgụgụ a gà-enye nkọwa burú ibu ná Okwu Chineke ndị ahụ ma nye gị ndụmọdụ siri ike i pụrụ iji mee ihe nà ka i pụrụ isi ji ndụ gị fọdụrụ gị n'ụwa a mee ihe!
More


