Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ụkpụrụ nchịkwa oge sitere n'Okwu ChinekeIhe Nhụchatụ

Time Management Principles From God’s Word

ỤBỌCHỊ 3 NKE 6

Chịkọta Nkwa Gị Gasị

Jizọs nyere iwu ka “Ee” anyị bụrụ “Ee,” n'ezie ma ọtụtụ mgbe, “Ee” nke Onye Kraịst pụtara “Mba.” Oge ọbụla anyị na-emezughị nkwa ahụ anyị kwere, anyị apụtaghị n'oge, anyị arụchaghị ọrụ anyị n'oge, ma ọ bụ anyị emezughị nkwa ozi olu anyị na anyị "ga-akpọghachi gị n'ekwenti ngwa ngwa," anyị na-enupụrụ Jizọs isi n'iwu Ọ nyere ka “Ee” anyị bụrụ “Ee.” N'ndụ nke anyị na-ebi ọsọ ọsọ, anyị na-ekwu "Ee" karịa mgbe ọ bụla, ebe ọtụtụ mgbe ọ na-adaba na anyị adịghị edebe okwu anyị. Ihe a hụrụ anya bụ na mmehie a dị ka ihe na-adịghị njọ kwesịrị ịbụ nke akpachapụrụ anya n'ime Nzukọ-Kraịst. Anyị bụ ihe oyiyi nke Chineke, ihe nnọchianya nke Jizọs Kraịst nye ụwa nke furu efu. Iji gosipụta onwe anyị nke ọma dịka ihe oyiyi Onye Nzọpụta anyị, anyị ga-aburiri ndị na-edebe okwu anyị.

Mana kedu ka anyị ga-esi eme nke a n'ezie? Ọ na-amalite site n'inwe usoro iji nakọta nkwa anyị niile nke ọma. Nke a nwere ike ịdị mfe dị ka ide ha n'mpempe akwụkwọ ma ọ bụ ịchịkọta ha n'ụzọ tara akpụ jiri dijital sistemụ njikwa ọrụ dị ka OmniFocus. Ngwá eji arụ ọrụ adịghị nnukwu mkpa karịa usoro eji arụ ya. Ọ bụrụ na anyị ga-agbaso iwu Jizọs bụ́ ka “Ee” anyị bụrụ “Ee,” anyị ga-enweriri ụzọ anyị ga-esi na-edebe ihe nile anyị na-asị “Ee” nye. Ọ dị ka ihe ọgụgụ isi zuru ezu, ọ kwa ya? N'ezie! Mana ọ dị nwute na mmadụ ole na ole na-eme nke a nke ọma. Ozi ọma dị bụ na, nke a bụ nsogbu dị ezigbo mfe idozinwu.

N'ime oge gị taa, were nkeji iri atọ mee “mwụpụta-uche” nke nkwa ọ bụla i meworo nye onwe gị, nye ndị enyi gị, nye di gị ma ọ bụ nye nwunye gị, nye ụmụ gị, nye ndị ọrụ ibe gị, wee dịrị gawa. Ozugbo ndepụta gị zuru ezu, chọọ nkwa ndị ị ga-akpagharị n'ụka ka isi wee kwee ha ma ọ bụ ndị ị ga-emezu ngwa ngwa. Dịka ọmụmaatụ, ikekwe ị kwere nne nne gị nkwa na ị ga-akpọ ya n'izu gara aga ma ị ka kpọbeghị ya. Were nkeji ise jiri kpọọ nne nne gị ma mezuo nkwa a. Ka "Ee" gị bụrụ "Ee" ọbụlagodi na ị gburu oge n'mmezu nkwa gị. Ana m ekwe gị nkwa, ozugbo ị mechara mgbatị uche a ma nwee ntụkwasị obi na nkwa niile ị kwere esila n'echiche gị pụọ, ị ga-enwe nnukwu nda jụụ na udo dị ukwuu.

Akwụkwọ David Allen dere, Ime Ihe Ka A Hụrụ Anya, bụ ihe kacha mma m chọtara iji nyere gị aka idebe nkwa gị niile ị kwere. Pịa ebe a iji budata mkpirisi nkọwa nke akwụkwọ a na ndụmọdụ ndị ọzọ gbasara otu esi eme ị hụ na "Ee" gị mgbe niile pụtara "Ee” n'ezie.

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Time Management Principles From God’s Word

Obi ọ n'ahikpọ́ gị nà enweghị ihe karịrị awa iri abụọ na anọ n'otu ụbọchị? Ihe ndị idepụ̀tajụrụ̀ ime ha n'enye gị nsogbu? Ike ịdị ike ọgwụgwụ ọ gwụla gị n'ihi na ịnweghị oge ịgụ Okwu Chineke na gị na ezinụlọ gị, na ndị enyi gị ịnọkọ? Ihe ndị a nwerè ike ịbụ nsogbu ndị ana ahụkarị n'ụwa. Oziọma dịnụ bụ̀ na Akwụkwọ Nsọ n'enye ụkpụrụ gasị doro anya maka anyị ijikwa oge anyị nke ọma. Atụmatụ ihe ọgụgụ a gà-enye nkọwa burú ibu ná Okwu Chineke ndị ahụ ma nye gị ndụmọdụ siri ike i pụrụ iji mee ihe nà ka i pụrụ isi ji ndụ gị fọdụrụ gị n'ụwa a mee ihe!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Jordan Raynor maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://www.jordanraynor.com/time/