Ụkpụrụ nchịkwa oge sitere n'Okwu ChinekeIhe Nhụchatụ

Tọọ Ókè Gị Gasị
N'ime ozi ọma niile, Matiu, Mak, Luk, na Jọn rịba ama ugboro ugboro oge Jizọs ji nọrọ naanị Ya—si ebe ndị na-eso ụzọ Ya nọ pụọ, si ebe ìgwè mmadụ ahụ nọ pụọ, na si n'ezughị ike nke ọrụ dị n'ozi Ya pụọ. Okwu a ana-ekwukarị banyere omume Jizọs a na-egosi na Jizọs bụ ọkà n'iwepụta ókè n'oge Ya. N'otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị ga-ejizi oge anyị nke ọma ma nye onyinye kachasị ukwuu n'ụwa, anyị onwe anyị kwa ga-eme ezigbo nhazi site n'iwepụta oké doro anya n'oge anyị n'ihe ọ bụla anyị na-eme.
Dị ka Jizọs, nke a kwesịrị ịmalite site n’iwepụta oge ugboro ugboro maka ekpere (Mak 1:35) na ịmụ Okwu Chineke. Omarala ọtụtụ n'ime anyị ahụ maka inye ego anyị otu ụzọ n'ụzọ iri. Mana kedukwanu maka inye otu ụzọ n'ụzọ iri n'oge anyị? Ọ bụrụ na anyị ejupụta oge anyị n’ihe ndị anyị na-arụ n’ọrụ na n’ụlọ ma e mesịa anyị ana agbalị ịchọta oge iji kpee ekpere na ịmụ Okwu Chukwu, ọ bụ naanị ọdịda dị n'ihu anyị. Tupu gị a gaa n'ihu n'ihe ọmụmụ a, cheba echiche iji kpebie maka oge ị ga-ewepụta inye dị ka otu ụzọ n'ụzọ iri maka ekpere na ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị.
Ozugbo i debere ókè doro anya n'ihazi oge gị maka ọzụzụ ime mmụọ, ọ ga-abakwa uru ime otú ahụ maka ịhazi oge gị n'ụlọ gị na n'ọrụ gị. Nye m, usoro ihe omume m mgbe niile na-enyere m aka idobe “nguzozi-nke-ọrụ m-na-ndụ m” ka ọ ghara igbasa. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụbọchị ọ bụla, a na m aga n'ebe m n'aru ọrụ ebe ọ jirile Iri anọ na ise gafee elekere Anọ nke ụtụtụ, mụ na aloghachikwa n'ụlọ m n'elekere Anọ nke uhuruchi. Usoro ihe omume m a marala m ahụ na-atụrụ m oke doro anya nke n'eme ka m manye onwe m itinye uche n'ọrụ m. Ana m arụcha ọrụ m arụcha? Mba nụ. Nke ahụ ga-abụkwa eziokwu ọ bụrụgodị na m rụrụ ọrụ ruo elekere Ise, elekere Isii, ma ọ bụ elekere Iri. Ọ dịghị ihe dịka a rụchaala ọrụ. Itinye akara njedebe siri ike n'usoro ihe m n'eme kwa ụbọchị n'ụlọ ọrụ m na-eme ka m nwee oge buru ibu nwunye m, ụmụaka m na ezinụlọ m nke ọgbakọ Kraịst iji nọrịa.
Ọ bụrụ na iwepụtaghị oge iji tinye akara nhazi n'usoro ihe ndị ị na-eme kwa ụbọchị, onye ọzọ ga-emere gị ya. Ọ bụrụ na imebeghị ya, gbasoo ụzọ Jizọs ma wepụta ókè doro anya n'oge gị nke ị ga-eji n'eme ihe. Nke a bụ nzọụkwụ mbụ iji nweta njikwa n'ihe ndị ị kwadebere ime na ijikwa oge gị nke ọma.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Obi ọ n'ahikpọ́ gị nà enweghị ihe karịrị awa iri abụọ na anọ n'otu ụbọchị? Ihe ndị idepụ̀tajụrụ̀ ime ha n'enye gị nsogbu? Ike ịdị ike ọgwụgwụ ọ gwụla gị n'ihi na ịnweghị oge ịgụ Okwu Chineke na gị na ezinụlọ gị, na ndị enyi gị ịnọkọ? Ihe ndị a nwerè ike ịbụ nsogbu ndị ana ahụkarị n'ụwa. Oziọma dịnụ bụ̀ na Akwụkwọ Nsọ n'enye ụkpụrụ gasị doro anya maka anyị ijikwa oge anyị nke ọma. Atụmatụ ihe ọgụgụ a gà-enye nkọwa burú ibu ná Okwu Chineke ndị ahụ ma nye gị ndụmọdụ siri ike i pụrụ iji mee ihe nà ka i pụrụ isi ji ndụ gị fọdụrụ gị n'ụwa a mee ihe!
More