Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mmegbu Rụrụ ArụIhe Nhụchatụ

Abuse

ỤBỌCHỊ 1 NKE 7

Mmegbu nwerè ike ime n'ụdị dị iche iche. Anụ ahụ, mmetụta-uche na mmekọahụ bụ ụzọ mmegbu dị iche iche ana-ahụkarị ma ọtụtụ ndị mmadụ amaghị ka ha gà-esi meso ya omume, chịkwaa ma ọ bụ dozie ya. Ọ bụrụ na ị bụ̀ onye na-emegbu mmadụ ibe ya, kwụsị ya. Ọ bụrụ na e metọrọ gị, ka ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru duzie gị ka ị nà-ekpebi otú ị gà-esi na-emekọrịta ihe n’ebe onye ahụ na-emetọ gị nọ. Ọ bụrụ na ị nọ n'ihe egwù, ịkwesịrị ịpụ ozugbo. Ọ bụrụ na mmeso a na-emegbu gị abụghị ihe na-eyi ndụ gị egwù ma ọ bụ̀kwanụ ya abụrụ ihe mere n’oge gara aga nke ị ka n'enwe mgba na ya, wepụta oge tụgharịa uche n’Okwu Chineke n'ihe a n'enye gị nsogbu.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Abuse

O nweghị onye kwesịrị ka e mejọọ ya. Chineke hụrụ gị n'anya ma chọọ ka e jiri gị kpọrọ ihe ma lekọta gị. Ọ dịghị mmejọ, ọ dịghị émétághị ihe, ọ dịghị nghọtahie kwesịrị ma ọlị ka eji mmegbu nke anụ ahụ, mmekọahụ, ma ọ bụ mmetụta-uche zaghachi ya. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị asaa gà-enyere gị aka guzobe nghọta na Chineke chọrọ ikpe ziri ezi, ịhụnanya, na nkasi-obi maka onye ọ bụla.

More

We would like to thank Life.Church for providing this plan. For more information, please visit: www.life.church