YouVersion Logo
Search Icon

JOSHUA 19

19
1Ife-nzà nke-abua we putara Simeon, bú ebo umu Simeon dika ab͕uru nile ha si di: ihe-nketa-ha di n'etiti ihe-nketa umu Juda. 2Ha we nwe n'ihe-nketa-ha Bia-sheba, ma-ọbu Sheba, na Molada; 3na Haza-shual, na Bala, na Ezem; 4na Eltolad, na Betul, na Họma; 5na Ziklag, na Bet-makabot, na Haza-susa; 6na Bet-lebaot, na Sharuhen; obodo iri na atọ na obodo ntà ha: 7na Ain, na Rimon, na Eta, na Ashan; obodo anọ na obodo ntà ha: 8na obodo ntà nile nke di obodo ndia buruburu rue Bealat-bia, bú Rema nke Negeb. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Simeon dika ab͕uru nile ha si di. 9Site n'òkè umu Juda ka ihe-nketa umu Simeon di: n'ihi na òkè umu Juda riri nne kari ha: umu Simeon we keta ihe n'etiti ihe-nketa-ha.
10Ife-nzà nke-atọ we putara umu Zebulun dika ab͕uru nile ha si di: ókè-ala ihe-nketa-ha we di rue Sarid: 11ókè-ala-ha we rigo n'akuku Ọdida-anyanwu, ru kwa Marala, we metu Dabeshet, metu kwa miri-iyi nke di n'iru Jọkneam; 12o si na Sarid chigharia n'akuku Iru-anyanwu n'ọwuwa-anyanwu rue ókè-ala Kislot-teboa; ọ pua rue Daberat, we rigo rue Jafia; 13o si n'ebe ahu gabiga n'akuku Iru-anyanwu n'akuku ọwuwa-anyanwu rue Gat-hefa, rue Et-kazin; ọ pua na Rimon, nke akpara rue Nea; 14ókè-ala ahu we b͕a ya buruburu n'Ugwu rue Hanaton: ọpupu-ya di kwa na ndagwurugwu Ifta-el; 15na Katat, na Nahalal, na Shimron, na Idala, na Bet-lehem: obodo iri na abua na obodo ntà ha. 16Nka bu ihe-nketa umu Zebulun dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha.
17Ife-nzà nke-anọ we putara Isaka, bú umu Isaka dika ab͕uru nile ha si di. 18Ókè-ala-ha we rue Jezreel, na Kesulot, na Shunem; 19na Hafaraim, na Shion, na Anaharat; 20na Rabit, na Kishion, na Ebez; 21na Remet, na En-ganim, na En-hada, na Bet-pazez: 22ókè-ala ahu we metu Teboa, na Shahazuma, na Bet-shemesh; ọpupu ókè-ala-ha di kwa na Jọdan: obodo iri na isi na obodo ntà ha. 23Nka bu ihe-nketa ebo umu Isaka dika ab͕uru nile ha si di, obodo ahu na obodo ntà ha.
24Ife-nzà nke-ise we putara ebo umu Asha dika ab͕uru nile ha si di. 25Ókè-ala-ha we buru Helkat, na Hali, na Beten, na Akshaf; 26na Alamelek, na Amad, na Mishal; ọ metu Kamel n'akuku Ọdida-anyanwu, metu kwa Shaihoa-libnat; 27ọ we chigharia n'ọwuwa-anyanwu rue Bet-degon, we metu Zebulun, metu kwa ndagwurugwu Ifta-el n'akuku Ugwu rue Bet-emek na Neiel; ọ pua rue Kabul n'aka-ekpe, 28na Ebron, na Rehob, na Hamon, na Kena, we rue Zaidon bara uba; 29ókè-ala ahu we chigharia rue Rema, ru kwa obodo ahu ewusiri ike, bú Taia; ókè-ala ahu we chigharia rue Hosa; ọpupu-ya di kwa n'oké osimiri site na Hebel rue Akzib: 30na Uma, na Efek, na Rehob: orú obodo na abua na obodo ntà ha. 31Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Asha dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha.
32Ọ bu umu Naftali ka ife-nzà nke-isi putara, bú umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di. 33Ókè-ala-ha we site na Helef, site n'osisi terebinth nime Zaananim, na Adami-nekeb, na Jabneel, rue Lakum; ọpupu-ya we di na Jọdan: 34ókè-ala ahu we chigharia n'akuku Ọdida-anyanwu rue Aznot-teboa, si n'ebe ahu pua rue Hukok; ọ metu Zebulun na Ndida, metu kwa Asha n'Ọdida-anyanwu, metu kwa Juda n'akuku Jọdan n'ọwuwa-anyanwu. 35Obodo ewusiri ike bu Zidim, na Zea, na Hamat, na Rakat, na Kineret; 36na Adama, na Rema, na Hezoa; 37na Kedesh, na Edrei, na En-hezoa; 38na Iron, na Migdal-el, na Horem, na Bet-anat, na Bet-shemesh; obodo iri na iteghete na obodo ntà ha. 39Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà ha.
40Ọ bu ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di ka ife-nzà nke-asa putara. 41Ókè-ala ihe-nketa-ha we buru Zọra, na Eshtaol, na Ia-shemesh; 42na Shaalabin na Ajalon, na Itla; 43na Ilon, na Timna, na Ekron; 44na Elteke, na Gibeton, na Bealat; 45na Jihud, na Bene-berak, na Gat-rimon; 46na Me-jakon, na Rakon, tiyere ókè-ala di na ncherita-iru Jafo. 47Ókè-ala umu Dan we si n'ebe ha nọ pua: umu Dan we rigo, buso Leshem agha, were ya, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, ha we nweta ya, biri nime ya, we kpọ Leshem, Dan, dika aha Dan, bú nna-ha, si di. 48Nka bu ihe-nketa ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha.
49Ha we mesia ka eketa ala ahu dika ókè-ala-ya nile si di; umu Israel we nye Joshua nwa Nun ihe-nketa n'etiti ha: 50n'okwu-ọnu Jehova ka ha nyere ya obodo ahu nke ọ riọrọ, bú Timnat-sera n'ugwu Efraim: o wue obodo ahu, biri nime ya.
51Ndia bu ihe-nketa, nke Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi ulo ndi bu nna ebo umu Israel, mere ka eketa n'ife-nzà nime Shailo n'iru Jehova, n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute. Ha we kebìe ala ahu.

Currently Selected:

JOSHUA 19: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy