YouVersion Logo
Search Icon

JOSHUA 18

18
1Nzukọ nile nke umu Israel we kpọkọta onwe-ha na Shailo, ma ulo-ikwū nzute n'ebe ahu: ewe buda ala ahu n'iru ha. 2Ebo asa we fọdu n'etiti umu Israel, ndi anēkeghi ihe-nketa-ha. 3Joshua we si umu Israel, Rùe ole mb͕e ka unu onwe-unu gābu ndi-ume-ngwu ibà inweta ala ahu, nke Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, nyeworo unu? 4Doronu onwe-unu ndikom atọ inọrọ ebo ọ bula: m'gēziga kwa ha, ha gēbili kwa, jegharia n'ala nka, de ya n'akwukwọ dika ihe-nketa-ha si di; ha gābiakutekwam. 5Ha gēkè kwa ya òkè asa: Juda gēguzo n'ókè-ala-ya na Ndida, ulo Josef gēguzo kwa n'ókè-ala-ha n'Ugwu. 6Unu onwe-unu gēde kwa ala ahu n'akwukwọ n'òkè asa, wetaram akwukwọ ahu n'ebe a: m'gēfe-kwa-ra unu nzà n'ebe a n'iru Jehova, bú Chineke-ayi. 7N'ihi na ndi Livai enweghi òkè n'etiti unu; n'ihi na ọlu-nchu-àjà Jehova bu ihe-nketa-ha: Gad na Reuben na nkera ebo Manase anarawo kwa ihe-nketa-ha n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, nke Moses, bú orù Jehova nyere ha. 8Ndikom ahu we bilie, je: Joshua we nye ndi nēje ide ala ahu n'akwukwọ iwu, si, Jenu, jegharia n'ala nka, de ya n'akwukwọ, laghachikutem, m'gēfe-kwa-ra unu nzà n'ebe a n'iru Jehova, nime Shailo. 9Ndikom ahu we je, gabiga n'ala ahu, de ya n'akwukwọ dika obodo nile si di n'òkè asa, ha we biakute Joshua rue ọmuma-ulo-ikwū nime Shailo. 10Joshua we fere ha nzà nime Shailo n'iru Jehova: Joshua we kère umu Israel ala n'ebe ahu dika esi kè ha n'òkè n'òkè.
11Ife-nzà nke ebo umu Benjamin we puta dika ab͕uru nile ha si di; ókè-ala nke ihe-ife-nzà-ha we puta n'etiti umu Juda na umu Josef. 12Ókè-ala ha nwere n'akuku Ugwu we site na Jọdan; ókè-ala ahu we rigo rue akuku Jeriko n'Ugwu, rigo kwa n'ugwu n'akuku Ọdida-anyanwu; ọpupu-ya di kwa n'ọzara Bet-even. 13Ókè-ala ahu we si n'ebe ahu gabiga rue Luz, rue akuku Luz (nke ahu bu Bet-el), n'akuku Ndida; ókè-ala ahu we rida rue Atarot-ada, n'elu ugwu nke di na Ndida nke Bet-horon di n'okpuru. 14Ewe kpa ókè ahu, o we b͕a buruburu rue akuku Ọdida-anyanwu n'akuku Ndida, site n'ugwu nke di n'iru Bet-horon n'akuku Ndida; ọpupu-ya di kwa na Kiriat-beal (nke ahu bu Kiriat-jearim), bú obodo umu Juda: nka bu akuku Ọdida-anyanwu. 15Akuku Ndida we site na nsọtu Kiriat-jearim, ókè-ala ahu we pua n'akuku Ọdida-anyanwu, pua rue isi-iyi miri Neftoa: 16ókè-ala ahu we rida rue nsọtu ugwu ahu nke di n'iru ndagwurugwu nwa Hinom, nke di na ndagwurugwu Refaim n'akuku Ugwu; ọ rida rue ndagwurugwu Hinom, rue akuku ndi Jebus n'akuku Ndida, we rida rue En-rogel; 17ewe kpa ókè-ala ahu n'Ugwu, ọ pua n'En-shemesh, pu kwa rue Gelilot, nke di na ncherita-iru nrigo Adumim; ọ rida rue nkume Bohan nwa Reuben; 18ọ gabiga rue akuku na ncherita-iru Araba n'akuku Ugwu, we rida rue Araba: 19ókè-ala ahu we gabiga rue akuku Bet-họgla n'akuku Ugwu: ọpupu ókè-ala ahu di kwa n'ọnu-miri Ugwu nke Oké Osimiri Nnú, na nsọtu Ndida nke Jọdan; nka bu ókè-ala Ndida. 20Jọdan bu kwa ókè-ala-ya n'akuku Iru-anyanwu. Nka bu ihe-nketa umu Benjamin, dika ókè-ala-ya nile si di buruburu dika ab͕uru nile ha si di. 21Ma obodo ebo umu Benjamin nwere dika ab͕uru nile ha si di bu Jeriko, na Bet-họgla, na Emek-keziz; 22na Bet-araba, na Zemaraim, na Bet-el; 23na Avim, na Para, na Ọfra; 24na Kefa-amoni, na Ọfni, na Geba; obodo iri na abua na obodo ntà ha: 25na Gibeon, na Rema, na Beirot; 26na Mizpeh, na Kefira, na Moza; 27na Rekem, na Iapeel, na Tarala; 28na Zela, na Elef, na ndi Jebus (nke ahu bu Jerusalem), na Gibeat, na Kiriat; obodo iri na anọ na obodo ntà ha. Nka bu ihe-nketa umu Benjamin dika ab͕uru nile ha si di.

Currently Selected:

JOSHUA 18: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy