YouVersion Logo
Search Icon

NEHUM 3

3
1Ahuhu diri obodo ọbara! o juputasiri n'okwu-ugha na ndọka; ndọb͕u-anu adighi-apu na ya. 2Ge nti olu utali, na olu nke ùzù wheel; na inyinya nāwuli awuli, na ub͕ọ-ala nāmali amali; 3na onye-inyinya nēme ka inyinya-ya rigo, na mma-agha nēb͕upu eb͕upu, na ube nēb͕u àmùmà; na ọtutu ndi eb͕uru eb͕u, na oké obo ozu; ọ dighi kwa ọgwugwu diri ozu-ha; ha nāsu ngọngọ n'ozu-ha: 4n'ihi iba-uba nke ikwa-iko nile nke nwanyi nākwa iko onye mara nma nke-uku, bú nwanyi nwe mb͕asi di iche iche, nke nēre mba di iche iche site n'ikwa-iko-ya nile, na ab͕uru di iche iche site na mb͕asi-ya nile. 5Le, Mu nēmegide gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēkpughe kwa ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi n'iru-gi, me ka mba nile hu ọtọ-gi, na ala-eze nile ka ha hu ihere-gi. 6M'gātukwasi kwa gi ihe-árú di iche iche, M'gākpọ kwa gi ihe-nzuzu, do gi ka ihe ile anya. 7O gēru kwa, na ndi nile ndi nāhu gi gāb͕anari gi, si, Ebibiwo Nineve: ònye gēgosi ya ebere o ji n'aru ya? Òle ebe M'gāchọputara gi ndi-nkasi-obi? 8Ì di nma kari No-amon, nke bi n'etiti osimiri Nail nile, nke miri di ya buruburu; nke ékpè-ya bu oké osimiri, oké osimiri ka mb͕idi-ya sitere? 9Etiopia bu ume-ya, ya na Ijipt, ọ dighi kwa ọgwugwu diri ya; Put na Lubim buri ndi-iye-aka-gi. 10Ọbuná obodo ahu ka emere ka ọ je biri n'ala ọzọ, ọ lara na ndọta-n'agha: atupia-kwa-ra umu-ya nāṅu ara n'isi èzí nile: ọ bu kwa ndi di nsọpuru ya ka ha fekwasiri nzà, eke-kwa-ra ndi uku ya nkpọrọ. 11Gi onwe-gi gāṅubiga kwa manya ókè, i gābu onye zoro ezo; gi onwe-gi gāchọ kwa ebe siri ike, n'ihi onye-iro. 12Ebe-gi nile ewusiri ike gādi ka osisi fig nwere nkpuru-osisi fig buru uzọ cha: ọ buru na arùru ha arù, ha adabá n'ọnu onye nēri ha. 13Le, ndi-gi bu ndinyom n'etiti gi; ndi-iro-gi ka emeghepusiworo ọnu-uzọ-ama nile nke ala-gi nye: ọku eripiawo ihe-ntuchi-gi nile. 14Sere onwe-gi miri nke nnọchigide-n'agha, me ka ebe-gi nile ewusiri ike sie ike: ba n'urọ, zọta ájá, jide ihe eji akpu brick. 15N'ebe ahu ka ọku gēripia gi; mma-agha gēbipu gi, ọ gēripia gi dika ukpala: me onwe-gi ka i rie nne dika ukpala, me onwe-gi ka i rie nne dika igurube. 16I mewo ka ndi-ahia-gi ba uba kari kpakpando nke elu-igwe: ukpala enwopuwo iwere-ya, felaga. 17Ndi-gi ekpubeworo okpu-eze di ka igurube, ndi-ọchi-agha-gi di kwa ka ìgwè igurube, ndi nēbe n'ogige ab͕ara ab͕a n'ubọchi juru oyi, ma mb͕e anyanwu wara ha felaga, amaghi kwa ọnọdu-ha ebe ha nọ. 18Ndi-ọzùzù-aturu-gi atuwo òrù-ura, gi eze Asiria: ndi-ebube-gi nwere ebe-obibi-ha n'ájá: ndi-gi ab͕asawo n'elu ugwu nile, ọ dighi kwa onye-nchikọta ha nwere. 19Ọ dighi nbilata nb͕aji ab͕ajiri gi nwere; ntiputa-ọnyá-gi jọrọ njọ: ndi nile ndi nānu ihe-ọnunu bayere gi gākukpo gi aka-ha; n'ihi na ònye ka ihe ọjọ gi nāgabigaghi n'isi-ya mb͕e dum?

Currently Selected:

NEHUM 3: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy