YouVersion Logo
Search Icon

MATIU 2

2
1Ma mb͕e amuru Jisus na Betlehem nke Judia n'ubọchi Herod, bú eze, le, ufọdu ndi mara ihe, ndi sitere n'Ọwuwa-anyanwu, biaruru Jerusalem, 2si, Òle ebe Ọ nọ, bú Onye amuru ibu Eze ndi-Ju? n'ihi na ayi huru kpakpando-Ya n'Ọwuwa-anyanwu, ayi we bia ikpọ isi ala nye Ya. 3Ma mb͕e Herod, bú eze, nuru, obi lọrọ ya miri, ya na Jerusalem nile. 4O we me ka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ nile nke ndi-Ju zukọ, o we jua n'ọnu-ha ebe agāmu Kraist nke ha. 5Ha we si ya, Na Betlehem nke Judia: n'ihi na otú a ka edeworo ya n'akwukwọ site n'aka onye-amuma, si,
6Gi Betlehem kwa, ala Juda,
I dighi nke-ntà kachasia n'etiti ndi-isi Juda ma-ọli:
N'ihi na n'etiti gi ka Onye-isi gāputa,
Onye gāzù ndi nkem Israel dika aturu.
7Mb͕e ahu Herod kpọrọ ha na nzuzo, bú ndi ahu mara ihe, o we juta nke-ọma n'ọnu-ha oge kpakpando ahu nke nāputa ìhè. 8O we zìe ha je Betlehem, si, Ganu chọputa nke-ọma okwu bayere Nwatakiri ahu; ma mb͕e ọ bula unu gāchọta Ya, bia kọrọm, ka mu onwem we je kwa kpọ isi ala nye Ya. 9Mb͕e ha nuru okwu eze ahu, ha we ga; ma le, kpakpando ahu, nke ha huru n'Ọwuwa-anyanwu, ọ nāga n'iru ha, rue mb͕e ọ biara guzo n'elu ebe Nwatakiri ahu nọ. 10Mb͕e ha huru kpakpando ahu ha we ṅuria oké ọṅù nke-uku. 11Ha we ba nime ulo, hu Nwatakiri ahu, Ya na Meri nne-Ya; ha we da n'ala kpọ isi ala nye Ya; ha we kpughe ib͕e àkù ha, che onyinye n'iru Ya, ọla-edo na frankincense na myrrh. 12Ebe Chineke duru ha ọdú na nrọ ka ha ghara ilaghachi jekuru Herod, ha we wezuga onwe-ha ga ala-ha site n'uzọ ọzọ.
13Ma mb͕e ha wezugasiri onwe-ha, le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi were onwe-ya gosi Josef na nrọ, si, Bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya b͕alaga n'Ijipt, nọ n'ebe ahu rue mb͕e ọ bula m'gāgwa gi: n'ihi na Herod gaje ichọ Nwatakiri ahu ka ọ la Ya n'iyì. 14O we bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya n'abali, wezuga onwe-ya ga Ijipt; 15O we nọ n'ebe ahu rue ọnwu Herod: ka okwu Onye-nwe-ayi kwuru site n'ọnu onye-amuma-Ya we mezu, si, Site n'Ijipt ka M'kpọputara Nwam. 16Mb͕e ahu Herod, mb͕e ọ huru na ndi ahu nke mara ihe mere ya ihe-ọchì, ọnuma di ya n'obi nke-uku, o we ziga, b͕uchasia umuaka-ndikom nile di na Betlehem, na n'ókè-ala-ya nile, site na ndi b͕ara arọ abua we rida, dika oge ahu nke ọ jutara nke-ọma n'ọnu ndi ahu mara ihe. 17Mb͕e ahu ka emezuru okwu ekwuru site n'ọnu Jeremaia onye-amuma, si,
18Anuru olu na Rema,
Ikwa-ákwá na iru-újú uku,
Rechel nākwara umu-ya ákwá;
Ọ chọghi kwa ka akasie ya obi, n'ihi na ha adighi.
19Ma mb͕e Herod nwusiri, le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi were onwe-ya gosi Josef na nrọ n'Ijipt, 20si, Bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya, ga ala Israel: n'ihi na ndi nāchọ ndu Nwatakiri ahu anwuwo. 21O we bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya, je ala Israel. 22Ma mb͕e ọ nuru na Akeleọs bu eze Judia n'ọnọdu nna-ya Herod, ọ turu egwu ije ebe ahu; ma ebe Chineke duru ya ọdú na nrọ, o wezugara onwe-ya ga n'akuku Galili, 23we bia biri n'obodo anākpọ Nazaret: ka okwu ekwuru site n'ọnu ndi-amuma we mezu, na agākpọ Ya Onye Nazaret.

Currently Selected:

MATIU 2: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy