YouVersion Logo
Search Icon

JOSHUA 3

3
1Joshua we bilie n'isi-ututu, ha we si na Shitim bilie ije, we biarue Jọdan, ya onwe-ya na umu Israel nile; ha we nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu tutu ha agabiga. 2O rue, n'ọgwugwu ubọchi atọ, na ndi-ọchi-agha gabigara n'etiti ọmuma-ulo-ikwū; 3ha we nye ndi Israel iwu, si, Mb͕e unu nāhu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, na ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ka ha nēbu ya, unu onwe-unu gēsi kwa n'ebe unu nọ bulie ije, we nējeso ya. 4Nání, ókè gādi n'etiti unu na ya, dika nnù cubit ise n'ọtùtù: unu abiarula nso ya, ka unu we mara uzọ nke unu gēsi je; n'ihi na unu agabigaghi n'uzọ a na mb͕e gara aga. 5Joshua we si ndi Israel, Donu onwe-unu nsọ: n'ihi na echi ka Jehova gēme ihe-ebube di iche iche n'etiti unu. 6Joshua we gwa ndi-nchu-àjà okwu, si, Bulienu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu-ahu, gabiga n'iru ndi Israel. Ha we bulie ib͕e ọb͕ub͕a-ndu ahu, we nēje n'iru ndi Israel. 7Jehova we si Joshua, Ta ka M'gāmalite ime ka i di uku n'anya Israel nile, ka ha we mara na otú M'nọyere Moses, otú a ka M'gānọyere gi. 8Gi onwe-gi gēnye kwa ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu ahu iwu, si, Mb͕e unu gābiaru nsọtu miri Jọdan, unu gēguzo na Jọdan.
9Joshua we si umu Israel, Bianu nso ebe a, nuru okwu nile nke Jehova, bú Chineke-unu. 10Joshua we si, Nka ka unu gēji mata na Chineke Nke di ndu nọ n'etiti unu, Ọ ghaghi kwa inapu ha ala-ha n'iru unu, bú ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Haivait, na ndi-Perizait, na ndi-Giagashait, na ndi-Amorait, na ndi Jebus. 11Le, ib͕e ọb͕ub͕a-ndu nke Onye-nwe uwa nile nāgabiga n'iru unu nime Jọdan. 12Ma ub͕u a, werenu m'onwe-unu ndikom iri na abua sitere n'ebo nile nke Israel, otù nwoke otù nwoke diri ebo ọ bula. 13Ọ gēru kwa, mb͕e ọbu-ukwu ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e Jehova, bú Onye-nwe uwa nile, gēzu ike nime miri Jọdan, na agēbipu miri Jọdan, bú miri nke nēsi n'elu rida; ha gēguzo kwa n'otù obo. 14O rue, mb͕e ndi Israel siri n'ulo-ikwū nile ha bulie ije, igabiga Jọdan, ndi-nchu-àjà nēbu kwa ib͕e ọb͕ub͕a-ndu ahu n'iru ndi Israel; 15mb͕e ndi nēbu ib͕e ahu biaru-kwa-ra Jọdan, mb͕e ndi-nchu-àjà ndi, nēbu ib͕e ahu zọyere ukwu-ha nime nsọtu miri, (n'ihi na Jọdan nēruchi usọ-ya nile ubọchi nile nke owuwe-ihe-ubi,) 16na miri ahu nke nēsi n'elu rida guzoro, we bilie n'otù obo, n'ebe di anya nke-uku, n'Adam, bú obodo nke di n'akuku Zaretan: ebìpusi-kwa-ra miri nke nērudata rue osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú: ndi Israel we gabiga na ncherita-iru Jeriko. 17Ndi-nchu-aja ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova we guzo n'ala-akọrọ n'etiti Jọdan, Israel nile we nagabiga n'ala-akọrọ, rue mb͕e mba ahu nile gabigasiri Jọdan.

Currently Selected:

JOSHUA 3: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy