YouVersion Logo
Search Icon

JỌN 20

20
1Ma n'ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa n'isi-ututu, mb͕e chi akābọghi, Meri Magdalini biaruru ílì ahu, we hu nkume-ya na ewepuwo ya n'ílì. 2Ya mere ọ b͕a ọsọ, biakute Saimon Pita, biakute kwa onye ọzọ ahu nēso uzọ Jisus, onye Jisus huru n'anya, si ha, Ha ebupuwo Onye-nwe-ayi n'ílì, ayi amataghi kwa ebe ha tọb͕orọ Ya. 3Ya mere Pita puru, ya na onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus, ha we nēje iru ílì ahu. 4Ha abua we b͕a ọsọ n'otù: onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus we b͕a kari Pita, buru uzọ biarue ílì ahu; 5o we ruru ala nyo nime ya, hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ; otú ọ di, ọ bàghi nime. 6Ya mere Saimon Pita bia kwa nēso ya, o we ba nime ílì ahu; o we hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ, 7ichafọ kwa, nke diri n'isi-Ya, ya na ezi ákwà-ozu ahu atọb͕ọghi n'otù ebe, kama aturuworo ya debe n'otù ebe di iche. 8Ya mere mb͕e ahu onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus, onye buru uzọ biarue ílì, bà-kwa-ra nime, o we hu, kwere kwa. 9N'ihi na ha akāmataghi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, na Ọ ghaghi isi na ndi nwuru anwu bilie. 10Ya mere ndi ahu ndi nēso uzọ Jisus laghachiri ọzọ n'ulo nke aka ha.
11Ma Meri nēguzo n'èzí na nso ílì ahu nākwa ákwá: ya mere, ka ọ nākwa, o ruru ala nyo nime ílì; 12o we hu ndi-mọ-ozi abua nēyi uwe ọcha ka ha nọduru ala, otù n'isi, otù kwa n'ukwu, n'ebe atọb͕ọrọri aru Jisus. 13Ndi ahu we si ya, Nwanyi, gini mere i nākwa ákwá? Ọ si ha, N'ihi na ha bupuru Onye-nwem, amatakwaghm ebe ha tọb͕ọrọ Ya. 14Mb͕e o kwusiri okwu ndia, o chigharia, we hu Jisus ka O guzoro, ma ọ mataghi na ọ bu Jisus. 15Jisus si ya, Nwanyi, gini mere i nākwa ákwá? ònye ka i nāchọ? Nwanyi ahu, ebe ọ nēchè na Ọ bu onye-nche ubi ahu ab͕ara ogige, ọ si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na Gi onwe-gi bupuru Ya, gwam ebe I tọb͕ọrọ Ya, mu onwem gēbupu kwa ya. 16Jisus si ya, Meri. Nwayi ahu chigharia, si Ya n'asusu Hibru, Rabonai; nke bu, Onye-ozizí. 17Jisus si ya, Emetulam aka; n'ihi na akāmarigogh lakuru Nnam: ma gakwuru umu-nnam, si ha, Anamarigo lakuru Nnam na Nna-unu, na Chinekem na Chineke-unu. 18Meri Magdalini bia kọrọ ndi nēso uzọ-Ya, si, Ahuwom Onye-nwe-ayi; ọkọ-kwa-ra ha otú Ọ gwara ya-ri ihe ndia.
19Ya mere mb͕e o ruru anyasi, n'ubọchi ahu, bú ubọchi mbu n'ízù, mb͕e emechi-kwa-ra uzọ nile ebe ndi nēso uzọ-Ya nọ, n'ihi egwu ndi-Ju, Jisus biara guzo n'etiti, si ha, Udo diri unu. 20Mb͕e O kwusiri nka, O gosi ha aka-Ya abua na akuku-Ya. Ya mere ndi nēso uzọ-Ya ṅuriri ọṅu, mb͕e ha huru Onye-nwe-ayi. 21Ya mere Jisus siri ha ọzọ, Udo diri unu: dika Nnam ziteworom, otú a ka Mu onwem nēziga kwa unu. 22Mgbe, ahu o kusa ha ume, si ha, Naranu Mọ Nsọ: 23ndi nile ọ bula unu nāb͕aghara nmehie-ha, ab͕agharawo ha nye ha; ndi nile ọ bula unu nējide nmehie-ha, ejidewo nmehie-ha.
24Ma Tomas, nke anākpọ Didimọs, otù onye nime ndi-ozi iri na abua ahu, anọghi n'etiti ha mb͕e Jisus biara. 25Ya mere ndi ọzọ nēso uzọ Jisus si ya, Ayi ahuwo Onye-nwe-ayi. Ma ọ siri ha, Ọ buru na ahughm n'aka-Ya abua apa ǹtú, tiye kwa nkpisi-akam n'apa ǹtú ahu, tiye kwa akam n'akuku-Ya, m'gaghi-ekwe ma-ọli.
26Mb͕e ubọchi asatọ ọzọ gasiri ndi nēso uzọ Jisus we nọ nime ulo, Tomas nọ kwa n'etiti ha. Jisus bia, mb͕e emechiri uzọ nile, O guzo n'etiti ha, si, Udo diri unu. 27Mb͕e ahu Ọ si Tomas, Setipu nkpisi-aka-gi n'ebe a, le akam abua; setipu kwa aka-gi, tiye nime akukum: aghọ-kwa-la onye nēkweghi, kama ghọ onye nēkwere. 28Tomas zara, si Ya, Onye-nwem na Chinekem. 29Jisus si ya, N'ihi na i huwom, ì kwerewo? ngọzi nādiri ndi akāhughi, ma ha kwere.
30Ya mere ọtutu ihe-iriba-ama ọzọ ka Jisus mere n'iru ndi nēso uzọ-Ya, nke anēdeghi n'akwukwọ a: 31ma edewo ihe ndia n'akwukwọ, ka unu we kwere na Jisus bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke; ka unu we nwe kwa ndu n'aha-Ya n'ihi na unu kwere.

Currently Selected:

JỌN 20: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy