YouVersion Logo
Search Icon

AISAIA 2

2
1Okwu nke Aisaia nwa Emoz huru bayere Juda na Jerusalem.
2O gēru kwa n'ikpe-azu nke ubọchi ndia, na ugwu nke ulo Jehova ganēguzosi ike n'elu ugwu nile, agēbuli kwa ya elu kari ugwu ntà nile; mba nile gērùbà nime ya dika osimiri. 3Ọtutu ndi di iche iche gēje kwa, si, Bianu, ka ayi rigorue ugwu Jehova, rue ulo Chineke nke Jekob; O gēzí kwa ayi uzọ-Ya ufọdu, ayi gēje kwa ije n'okporo-uzọ-Ya nile: n'ihi na Zaion ka iwu gēsi puta, okwu Jehova gēsi kwa na Jerusalem puta. 4Ọ gēkpe kwa ikpe n'etiti mba nile, dozi-kwa-ra ọtutu ndi di iche iche okwu-ha: ha gākpughari kwa mma-agha-ha nile ka ha buru mma-ọgè, na ube-ha nile ka ha buru mma-ikwa-osisi: mba agaghi-ebuli mma-agha megide mba, ha agaghi-amuta kwa agha ọzọ.
5Ulo Jekob, bianu, ka ayi jegharia n'ìhè Jehova. 6N'ihi na I rapuwo ndi-Gi, bú ulo Jekob, n'ihi na ha juputara n'ome-n'ala site n'Iru-anyanwu, ha bu kwa ndi ji igwe-oji atù isi ọma na isi ọjọ dika ndi Filistia, ọzọ, ha na umu ndi ala ọzọ nēkwekọ aka. 7Ala-ha juputa-kwa-ra n'ọla-ọcha na ọla-edo, ọ dighi kwa ọgwugwu diri àkù-ha; ala-ha juputa-kwa-ra n'inyinya, ọ dighi kwa ọgwugwu diri ub͕ọ-ala-ha. 8Ala-ha juputa-kwa-ra n'ihe-efu; ọlu nke aka-ha ka ha nākpọ isi ala nye, bú ihe nke nkpisi-aka-ha mere. 9Madu we ruda n'ala, onye di elu nēme kwa onwe-ya ka ọ di ala: ebupu-kwa-la nmehie-ha. 10Ba n'oké nkume, zobe kwa onwe-gi n'ájá, ipu n'iru oké egwu Jehova, na ipu n'ima-nma nke idi-elu-Ya. 11Aghaghi ime anya npako nke madu ka ha di ala, aghaghi kwa iruda nbuli-elu nke ndi nile n'ala, aghaghi kwa ime ka Jehova, nání Ya, di elu n'ubọchi ahu. 12N'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha nwere otù ubọchi nke gādakwasi ihe ọ bula di npako nke di kwa elu, ọ gādakwasi kwa ihe ọ bula ebuliworo elu; ewe me ya ka ọ di ala: 13ọ gādakwasi kwa osisi cedar nile nke Lebanon nke di elu nke ebuliwo-kwa-ra ha elu, ọ gādakwasi kwa osisi oak nile nke Beshan; 14ọ gādakwasi kwa ugwu nile nke di elu, ọ gādakwasi kwa ugwu ntà nile nke ebuliworo elu; 15ọ gādakwasi kwa ulo-elu ọ bula di elu, ọ gādakwasi kwa mb͕idi ọ bula ewusiri ike; 16ọ gādakwasi kwa ub͕ọ nile nke Tashish, ọ gādakwasi kwa ihe-ile-anya nile anāchọsi ike. 17Aghaghi kwa iruda npako madu, aghaghi kwa ime nbuli-elu nke ndi nile ka ọ di ala: aghaghi kwa ime ka Jehova, nání Ya, di elu n'ubọchi ahu. 18Ma ihe-efu-ha, ha nile aghaghi igasi. 19Madu gābà kwa n'ọb͕à nile nke oké nkume nile, na n'olùlù nile nke ájá, ipu n'iru oké egwu Jehova, na ipu n'ima-nma nke nbili-elu-Ya, mb͕e O biliri ime ka uwa ma jijiji nke-uku. 20N'ubọchi ahu madu gētufu ihe-efu-ya nile nke ọla-ọcha, na ihe-efu-ya nile nke ọla-edo, nke ha mere ka ọ we kpọ isi ala nye ha, ọ gētufu ha nye anu mole na usu; 21ka o we ba n'oghere nile nke oké nkume nile, na nime nb͕awa nile nke nkume nile di elu, ipu n'iru oké egwu Jehova, na ipu n'ima-nma nke nbili-elu-Ya, mb͕e O biliri ime ka uwa ma jijiji nke-uku. 22Rapunu madu, onye otù nku-ume di n'imi-ya: n'ihi na nìme gini ka aganāgu ya?

Currently Selected:

AISAIA 2: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy