YouVersion Logo
Search Icon

ESTA 3

3
1Mb͕e ihe ndia gasiri, eze, bú Ahasuerọs, mere Heman nwa Hamedata, bú onye Egag, ka ọ buru onye oku, o we bulie ya elu, do oche-eze-ya n'ebe di elu kari ndi-isi nile ya na ha nọ. 2Ndi-orù nile nke eze, ndi nọ n'ọnu-uzọ-ama eze, we nēruru ala, nākpọ kwa isi ala nye Heman: n'ihi na otú a ka eze nyere iwu bayere ya. Ma Mọdekai adighi-eruru ala, ọ dighi-akpọ kwa isi ala nye ya. 3Ndi-orù eze, ndi nọ n'ọnu-uzọ-ama eze, we si Mọdekai, Gini mere gi onwe-gi nāgabiga ihe eze nyere n'iwu? 4O rue, mb͕e ha nāgwa ya okwu kwa-ubọchi, ma ọ geghi nti ha, na ha gosiri Heman, ihu ma okwu Mọdekai gēguzo: n'ihi na o gosiri ha na ya onwe-ya bu onye-Ju. 5Heman we hu na Mọdekai adighi-eruru ala, na ọ dighi-akpọ kwa isi ala nye ya, Heman we juputa n'ọnuma. 6O we buru ihe-nleda-anya n'anya-ya iseti aka megide Mọdekai, nání ya; n'ihi na ha gosiri ya ndi Mọdekai: Heman we chọ ikpochapu ndi-Ju nile ndi nọ n'ala-eze nile nke Ahasuerọs, bú ndi Mọdekai. 7N'ọnwa mbu, nke ahu bu ọnwa Nisan, n'arọ nke-iri-na-abua nke eze, bú Ahasuerọs, ka ha fere Pua, nke ahu bu nzà, n'iru Heman, site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ, site kwa n'otù ọnwa ọzọ, rue ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada. 8Heman we si eze, bú Ahasuerọs, Otù ndi di ndi emeworo ka ha b͕asa, ndi ekesawo-kwa-ra ha n'etiti ndi di iche iche n'ala nile anāchi achi nke ala-eze-gi; iwu nile ha di kwa iche n'iwu ndi ọ bula; ha adighi-edebe kwa iwu nile nke eze: o kwesighi kwa eze ka o kwe ka ha nọduru onwe-ha. 9Ọ buru na ọ di eze nma, ka ede ya n'akwukwọ ime ka ha la n'iyì: m'gātù kwa orú nnù talent ọla-ọcha na nnù ise nye n'aka ndi nēje ozi a, iwebata ya n'ulo-àkù eze. 10Eze we si n'aka-ya wezuga nb͕a-aka-akàrà-ya nye ya Heman nwa Hamedata onye Egag, bú onye nākpab͕u ndi-Ju. 11Eze we si Heman, Enyewo gi ọla-ọcha, ya na ndi ahu, ime ha dika ihe ahu si di nke di nma n'anya-gi. 12Ewe kpọ ndi-ode-akwukwọ eze n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-atọ di nime ya, ewe de ya n'akwukwọ dika ihe nile si di nke Heman nyere ndi nọchiri anya eze n'iwu, nke o nye-kwa-ra ndi nāchi ala ndi bu ndi-isi ala ọ bula anāchi achi, nke o nye-kwa-ra ndi-isi ndi ọ bula; ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, na ndi ọ bula dika asusu-ya si di; n'aha eze, bú Ahasuerọs, ka edere ya, eji-kwa-ra nb͕a-aka-akàrà eze ka ya akàrà. 13Ewe site n'aka ndi-ọb͕a-ọsọ ziga akwukwọ n'ala nile anāchi achi nke eze, ikpochapu, na ib͕u, na ime ka ndi-Ju nile la n'iyì, site na nwata we rue okenye, ma umu-ntakiri ma ndinyom, n'otù ubọchi, n'ubọchi nke-iri-na-atọ nke ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada, na iluta ihe-nkwata-ha n'agha. 14Ndeputa odide-akwukwọ ahu, nke agēnye dika iwu n'ala nile ọ bula anāchi achi, ekpughere ya nye ndi nile di iche iche, ka ha nọ na njikere bayere ubọchi a. 15Ndi-ọb͕a-ọsọ puru, ebe ewere okwu eze me ka ha me ngwa, enye-kwa-ra iwu ahu nime Shushan, bú ulo uku eze: ma eze na Heman nọduru iṅu ihe-ọṅuṅu; ma ọ b͕ara obodo ahu, bú Shushan, ghari.

Currently Selected:

ESTA 3: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy