YouVersion Logo
Search Icon

II. IHE EMERE 2

2
1Solomon we si na o gēwuru aha Jehova ulo, wu-kwa-ra ala-eze-ya ulo. 2Solomon we guta orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise, bú ndi-ibu, na orú nnù ndikom uzọ iri ndi nāwa ihe-ọwuwa n'ugwu, na nnù ndikom iteghete ndi edoro ndi-isi-ha. 3Solomon we zigara Huram, bú eze Taia, ozi, si, Otú i mere Devid nnam, we zitere ya osisi cedar iwuru ya ulo ibi nime ya, me-kwa-ram otú a. 4Le, mu onwem nēwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo, idoro Ya nsọ, isure n'iru Ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na idebe n'ebe ahu achicha anēdo n'usoro mb͕e nile, na isure àjà-nsure-ọku n'ututu na n'anyasi, na n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na mb͕e nile akara àkà nke Jehova, bú Chineke-ayi. Rue mb͕e ebighi-ebi ka nka dikwasi Israel. 5Ma ulo nke mu onwem nēwu di uku, n'ihi na Chineke-ayi di uku kari chi nile. 6Ma ònye nwere ike iwuru Ya ulo, n'ihi na elu-igwe na elu-igwe nke elu-igwe nāgaghi-anagide Ya? ònye kwa ka mu onwem bu, na m'gēwuru Ya ulo, ma-ọbughi nání isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Ya? 7Ma ub͕u a ziterem otù nwoke mara ihe n'ilu ọlu n'ọla-edo, na n'ọla-ọcha, na n'ọla, na n'ígwè, na n'ogho ododo na ogho uhie na ogho anunu, onye ma-kwa-ra iso ndi mara ihe, ndi nọ n'ebe m'nọ na Juda na nime Jerusalem, bú ndi Devid nnam doziri, b͕u eb͕ub͕u. 8Si kwa na Lebanon ziterem osisi cedar, na osisi fir, na osisi algum: n'ihi na mu onwem amawo na ndi-orù-gi mara ib͕utu osisi nime Lebanon; ma, le, ndi-orùm gēso kwa ndi-orù-gi, 9ọbuná idozirim osisi n'uba: n'ihi na ulo ahu nke mu onwem nēwu gādi uku di kwa ebube. 10Ma, le, m'gēnye ndi-orù-gi, bú ndi nāwa ihe-ọwuwa ndi nēb͕utu osisi, orú nnù ọtùtù cor uzọ abua na nnù iri nke ọka wheat asuru asu, na orú nnù ọtùtù cor uzọ abua na nnù iri nke ọka barley, na orú nnù ọtùtù bath uzọ abua na nnù iri nke manya-vine, na orú nnù ọtùtù bath uzọ abua na nnù iri nke manu. 11Huram, bú eze Taia, we were odide-akwukwọ, nke o zitere Solomon, si, N'ihi na Jehova huru ndi-Ya n'anya, n'ihi ya ka O mere gi eze-ha. 12Huram we si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye mere elu-igwe na uwa, Onye nyeworo Devid, bú eze, nwa-nwoke nke mara ihe, onye mara ezi uche na nghọta, onye gēwuru Jehova ulo, wu-kwa-ra ala-eze-ya ulo. 13Ma ub͕u a ezitewom otù nwoke nke mara ihe, onye mara nghọta, nke Huram, bú nnam, 14bú nwa nke nwayi nke sitere n'umu-ndinyom Dan, ma nna-ya bu nwoke Taia, ọ bu onye mara ilu ọlu n'ọla-edo, na n'ọla-ọcha, na n'ọla, na n'ígwè, na nkume, na n'osisi, na n'ogho ododo, na n'ogho anunu, na n'ezi ákwà ọcha, na n'ogho uhie; na ib͕u eb͕ub͕u ọ bula, na ichèputa ihe-nchèputa ọ bula: ka ewe nye ya ọnọdu n'etiti ndi-gi mara ihe, na ndi mara ihe nke onye-nwem, bú Devid nna-gi. 15Ma ub͕u a ọka wheat ahu na ọka barley ahu na manu ahu na manya-vine ahu, bú nke onye-nwem kwuru, ya zitere ndi-orù-ya: 16Ayi onwe-ayi gēb͕utu kwa osisi site na Lebanon, dika nkpà-gi nile si di: ayi gāb͕a kwa ha me ka ha se n'elu oké osimiri rue gi aru, rue Jafo; gi onwe-gi gēbugota kwa ha na Jerusalem. 17Solomon we gua ndikom nile, bú ndi-ọbìa, ndi nọ n'ala Israel, mb͕e ọgugu ahu gasiri, bú nke Devid nna-ya guru ha; ewe hu na ha di orú nnù ndikom uzọ iri-na-iteghete na nnù anọ. 18O we me orú nnù uzọ asatọ na nnù iri-na-ise nime ha ka ha buru ndi-ibu, na orú nnù uzọ iri ka ha buru ndi nāwa ihe-ọwuwa n'ugwu, na nnù iteghete ka ha buru ndi edoro ndi-isi ime ka ndi ahu fè òfùfè.

Currently Selected:

II. IHE EMERE 2: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy