YouVersion Logo
Search Icon

I. TIMỌTI 6

6
1Ka ha ra, bú ndi-orù nke nọ n'okpuru yoke, ha gua ndi-nwe-ha na ndi kwesiri nsọpuru nile, ka ewe ghara ikwulu aha Chineke na ozizí-ayi. 2Ma ndi nwere ndi kwere ekwe dika ndi-nwe-ha, ka ha ghara ilelì ha anya, n'ihi na ha bu umu-nna-ha; kama ka ha buru orù-ha kari, n'ihi na ndi soro ha ke òkè n'ọlu ọma ha bu ndi kwere ekwe na ndi ahuru n'anya. Nēzí ihe ndia nādu kwa madu ọdú bayere ha.
3Ọ buru na onye ọ bula nēzí ihe di iche, nēkweyeghi kwa n'okwu nēnye ezi ndu, bú okwu nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na ozizí ahu nke di ka nsọpuru-Chineke si di; 4afuliwo ya elu, ọ dighi ihe ọ mara, kama ọria bayere ajuju na esem-okwu n'ihi okwu efu nāria ya, nke ekworo, esem-okwu, nkwulu, ajọ èchìchè, nēsi nime ha nāputa, 5bú iru-uka nke madu ndi mebiworo n'uche, ndi apunarawo-kwa-ra ha ezi-okwu, ebe ha nāgu na nsọpuru-Chineke bu uzọ irita urù. 6Ma nsọpuru-Chineke, ya na inwezu ihe nile di nkpà, bu uzọ irita urù nke-uku; 7n'ihi na ayi ewetaghi ihe ọ bula n'uwa, ọ bu kwa n'ihi na ayi apughi iwere ihe ọ bula pua nime ya; 8ma ebe ayi nwere ihe-oriri na ihe ib͕okwasi n'aru, afọ gēju ayi n'ihe ndia. 9Ma ndi nēzube ibu ọgaranya nādabà n'ọnwunwa na ọnyà na ọtutu agu ihe ọjọ nke uche nādighi nime ha, nke nēmeru kwa aru, bú ihe nēme ka madu mikpù emikpù nime nbibi na ila-n'iyì. 10N'ihi na ihu ego n'anya bu nkpọrọgwu nke ihe ọjọ nile di iche iche: nke ufọdu nāb͕asosi ike, ewe duhie ha n'okwukwe-ayi, ha were kwa ọtutu ihe-nb͕u dupue onwe-ha.
11Ma gi onwe-gi, onye nke Chineke, nāb͕anari ihe ndia; ma nāb͕aso ezi omume, nsọpuru-Chineke, okwukwe, ihu-n'anya, ntachi-obi, idi-nwayọ. 12Nāb͕asi nb͕a ọma nke okwukwe ike, jide ndu ebighi-ebi aka nke akpọrọ gi ka i nata ya, i kwuputa-kwa-ra nkwuputa ọma ahu n'iru ọtutu ndi-àmà. 13Anamenye gi iwu n'iru Chineke, Onye nēme ka ihe nile di ndu, ya na n'iru Kraist Jisus, Onye b͕ara àmà nkwuputa ọma ahu n'iru Pọntiọs Pailat; 14ka gi onwe-gi debe ihe ahu enyere n'iwu, nēnweghi ntupọ, onye anādighi-akalu akalu, rue ngosi nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist: 15nke Ọ gēgosi n'oge nke aka Ya, Onye nání Ya bu Onye di ike, Onye bu kwa onye di ngọzi, bú Eze kachasi ndi bu eze, Onye bu kwa Onye-nwenu kachasi ndi nāchi ka ndi-nwe madu; 16Onye nání Ya nwere anwughi-anwu, nēbi nime ìhè nke anāpughi ibiaru nso; Onye ọ dighi madu ọ bula huworo Ya anya, ma-ọbu pu ihu Ya anya: Onye nsọpuru na ike ebighi-ebi diri. Amen.
17Nēnye ndi bu ọgaranya n'oge di ub͕u a iwu, ka ha ghara itukwasi uche-ha n'ihe di elu, ghara kwa itukwasi obi n'ihe ahu anējighi aka, bú àkù, kama ka ha tukwasi obi na Chineke, Onye nēwere àkù-Ya nye ayi ihe nile ka ha buru ihe gātọ ayi utọ; 18ka ha nēme ezi ihe, ka ha buru ọgaranya n'ọlu ọma nile, ka ha buru ndi kwadebeworo ime ka ndi ọzọ keta ihe ha nwere, ka ha buru ndi kwere ka ndi ọzọ so ha nwekọ ihe; 19ka ha kpadoro onwe-ha ntọ-ala ọma nye oge gaje ibia, ka ha we jide ndu ahu nke bu ndu n'ezie.
20Biko Timọti, nēche ihe ahu enyere gi n'aka idebe, nēze okwu efu nile nke emeruru emeru nke ihe ahu anākpọ ihe-ọmuma n'uzọ ugha, ha na nguzogide-ya nile; 21bú ihe-ọmuma nke ufọdu kwuputara we hie n'ihe bayere okwukwe-ayi.
Ka amara diyere unu.

Currently Selected:

I. TIMỌTI 6: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy