YouVersion 標識
搜索圖示

Jenesis Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
E dere ihe dị nʼakwụkwọ Jenesis maka ịkọwa otu ihe niile siri malite. A kọwara na ọ bụ Chineke kere eluigwe niile na ụwa, kọwaa na e kere mmadụ nʼoyiyi Chineke, meekwa ya ka ọ nọdụ nʼebe dị nnọọ mma. A kọwara otu mmehie si bata nʼụwa, na otu Chineke si gbooro mmadụ mehiere megide iwu Onye kere ya mkpa nzọpụta. Nʼime akwụkwọ a, a ga-agụta otu ibi obi ndị mmadụ si malite, otu ọrụ ǹka niile si bido, na otu asụsụ dị iche iche si malitekwa. A ga-agụta ebe mba dị iche iche si pụta. Akwụkwọ a kọkwara akụkọ banyere mba ndị Juu, otu o si bido site nʼaka Ebraham, Aịzik na Jekọb, kọwaakwa otu ndị Juu si biri nʼala Ijipt.
Usoro e si dee ya:
Okike eluigwe na ụwa 1–2
Nnupu isi na mmalite mmehie 3–4
Akụkọ gbasara ibi ndụ ndị mmadụ ruo nʼoge uju mmiri 5–9
Mgbasa ụmụ mmadụ nʼelu ụwa 10–11
Akụkọ ndụ Ebraham 12:1–25:18
Akụkọ ndụ Aịzik 25:19–26:35
Akụkọ ndụ Jekọb na Ịsọ 27:1–37:1
Akụkọ ndụ Josef 37:2–50:26

醒目顯示

分享

複製

None

想要在所有設備上保存你的醒目顯示嗎? 註冊或登入

YouVersion 使用 cookie 來個性化你的體驗。透過使用我們的網站,你即接受我們按照我們的 隱私政策所述來使用 cookie。