Akụ Gị Kacha Mma!预览

Akụ Gị Kacha Mma!

5天中的第1天

“Nkwụghachi Ekwere na-Nkwa!”

N'ụwa taa, nkwupụta a na-ebuli ụfọdụ ajụjụ, yana ụfọdụ nyofu. Mana e nwere iwu n’achi uwa nile nke na-emetụta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ nile nke ndụ: iwu nke oge ọghigha-mkpụrụ na owuwe-ihe-ubi, ma ọ bụ n’ikwu ya n’ụzọ dị mfe karị, “ị ga-aghọrọ mkpụrụ ị ghara.”

Ị nweghị ike ịghọrọ ma ọ bụrụ na ị bughị ụzọ kụọ mkpụrụ. Ị nweghị ike nweta nkwụghachi ma ọ bụrụ na i bughị ụzọ tinye ego. Ịnweghị ike ịnweta uru nke ngwaahịa ma ọ bụ ozi ma ọ bụrụ na ị bụghị ụzọ zụọ ya. Ị nweghị ike idowe ahụike anụ ahụ ma ọ bụrụ na ị naghị eri nri kwesịrị ekwesị na ime mmega ahụ mgbe nile. Na ihe atụ ndị a nile, nkwụghachi anatara kwekọrọ na àgwà ma ọ bụ ego ebu ụzọ nye.

Otu iwu ahụ metụtakwara mmekọrịta anyị na Chineke. Anyị enweghị ike ịghọrọ ije zuru oke na nke agọziri agọzi n’iso Chineke ma ọ bụrụ na anyị ghara mkpụrụ nke ga-amịpụta owuwe ihe ubi ahụ. Ozi ọma ahụ bụ na Chineke enyewo anyị ezi mkpụrụ – a na-akpọ ya Okwu Ya, nke bụ́ Akwụkwọ Nsọ. Ịgha mkpụrụ n’ụba nke Okwu Chineke n’ime ndụ anyị na-emesi anyị obi ike na anyị ga-enwetaghachi nnukwu uru na ihe nkwughachi ahụ.

读经计划介绍

Akụ Gị Kacha Mma!

Inweta nloghachi gọziri agọzi na ụbara na-amalite site n'itinye ezigbo ego. Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst ọhụrụ, ọ dịghị ego ka ukwuu ị pụrụ itinye n’okwukwe gị karịa ịnara Okwu Chineke mgbe nile. Bido ebe a iji nyere gị aka ịgụ, ghọta na itinye ya nke ọma kwa ụbọchị. Ewepụtara site n'akwụkwọ a, “Site n’ụwa a; Akwụkwọ ntuziaka Ndị Kraịst maka Uto na Nzube” nke David J. Swandt dere.

More