Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Otu Okwu Ga-agbanwe Ndụ GịIhe Nhụchatụ

One Word That Will Change Your Life

ỤBỌCHỊ 4 NKE 4

Bie Okwu Gị

Dị Njikere
Mgbe Otu Okwu gị bịakwutere gị, ọ nwere ike ịbịa n'ụdị agwa, ihe ozuzu, mmadụ, nlebara anya nke mmụọ, ihe njirimara ma ọ bụ uru. Ihe atụ nke okwu ndị na-esonụ ị nwere ike iji mee ihe abụghị ka ọ bụrụ ndepụta nke ị ga-ahọriri ihe na, kama ọ bụ mmalite nke echiche ihe ndị ị nwere ike Iji wee mee ihe: ịhụnanya, ọñụ, ndidi, obiọma, izu ike, ekpere, ahụike, izu ahụ gị ozuzu, idi garagara, nraranye, mmekọrịta chiri anya, ozuzu, ịtinye obi, adịghị itu ujo, ịkwe omume, ịdị ihe akwụkwọ ndụ, ikpali nkpali, imecha, ịdị ọcha, iguzosi ike n'ezi ihe na isi ike.

Ịbipụta okwu gị ga-eme gị ka ị di nlebara anya ma mee gị ka uche gị ghara ịdọpụ. Anyị na-ahụ uru ọ bara Nehemaịa idi nlebara anya mgbe ọ na-ewu mgbidi ahụ. Na Nehemaịa 6:3, ọ sighị n'ọrụ ya rịdata, n'ihi na ọ na-eme otu ihe ahụ ọ kpebiri ime—iwu mgbidi ahụ! Ọ na-arụkwa nnukwu ọrụ. Cheta, mgbe ị na-ebi okwu gị, ị na-arụ nnukwu ọrụ.

Zopụ ukwu na mpaghara nkasi obi gị.

Usoro a na-atọ ụtọ, mana ọ ga-abụkwa ihe ịma aka. Ị ga-eche ihe mgbochi ndị ị na-atụghị anya ha ihu. A ga-agbatị gị—anyị n'ekwe gị nkwa nke a. Mana anyị na-amụtakarị ihe nke ọma mgbe anyị siri na mpaghara nkasi obi anyị pụọ, ya mere nọrọ n'usoro a.

Ọ dị mkpa icheta na ilekwasị anya n'okwu gị bido n'ime afọ ruo n'ogwugwu afọ. Ọ bụrụ na okwu gị anọghị n'isi uche gị, i ga-echefu ya.

Dobe Otu Okwu gị n'ihu na n'etiti.

N'ime ọtụtụ afọ nke nnwale na njehie, anyị achọpụtala ụzọ dị mfe na nke dị ike iji dobe Otu Okwu gị n'ihu na n'etiti n'ime afọ.

Nke mbụ, mapanye okwu gị n'ebe ndị i na-ele anya oge niile ka ị wee na-ahụ ya oge ọbụla. Ihe na-adọta nlebara anya gị na-eme ka uche gị dị n'ya; ihe na-eme ka uche gị dị n'ya ka a na-eme eme. Ịmepụta ihe ncheta dị mkpa. Dee ya edee ma tinye ya n'ebe ndị i ma ama, dị ka ebe ndebe ihe n'ụlọ akwụkwọ gị, n'ime ụgbọ ala gị, na tebụl gị ma ọ bụ ebe ị na-edebe ngwongwo gị.

Nke abụọ, kesaa okwu gị nye ndị Otu Mgbati gị—ndị enyi obi gị, ndị gị na ha n'arụkọ ọrụ na ndị ezinaụlọ gị ndị dị gị mkpa na ndị ị tụkwasịrị obi n’egbughị oge. Anyị na-akpọ ya ndị Otu Mgbati gị, n'ihi na ọ nwere ndị na-agbatị gị na ndị na-enyere gị aka itolite. Nye ha ikike ịjụ gị gbasara okwu gị.

Mgbe ị na-eme ihe abụọ a dị mfe—imapanyecha okwu gị ebe ị ga-ahu ya nke ọma na ikesara ya ndị ọzọ—ị na-eme ka uto gị dị ire. Ị ga-enwe ahụmahụ nke ọma na nke n'adịchaghị nma, mana ha niile bụ ihe ndị a na-ahu n'usoro ahụ. Ka ị na-ebipụta okwu gị, ka Chineke jiri ịdị mfe nke Otu Okwu gị bụ isiokwu gị gbanwee obibi ndụ gị kwa ụbọchị.

Gaa N'Ihu
1. Kedu otu ihe ị nwere ike ime iji cheta Otu Okwu gị?
2. Depụta mmadụ atọ ndị enyi obi gị ndị ị ga-ekesara okwu gị.
3. Kedu otu ị ga-esi bie Otu Okwu gị dị ka ezinụlọ, azụmahịa, otu ndị ọrụ?

Rụọ Ka Ọrụ
Nehemaịa 6, Ọrụ Ndị Ozi 4:16-20, Ndị Kọlọsi 3:17, 23

Rụfee Ka Ọrụ
"Onye-nwe-anyị, a na m ekpe ekpere ka Ị nyere m aka ibi okwu m n’ụzọ zuru oke n’afọ a. Dị ka Nehemaịa, tinye uche m n’ibi ya ma gbochie ihe ndọpụ uche. O bụrụ na ha abịa, nye m obi ike ka m lekwasị anya n’ihe Ị kpọrọ m ka m mee. N’aha Jizọs, amen."

Ị chọrọ ịme akwụkwọ mmado Otu Okwu nke gị? Gaa na: GetOneWord.com

Igodo: ụbọchị_ano ụbọchị_ano 15517 Bildschirmfoto 2021-11-11 um 20.59.05.png

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

One Word That Will Change Your Life

OTU OKWU ná-enyeré gị aka ime ka ndụ gị dị mfe site n'ilekwasị anya nanị n'OTU OKWU n'ime afọ dum. Ịdị mfe nke ịchọpụtà okwu Chineke nwerè maka gị nà-eme ka ọ bụrụ ihe na-akpalite mgbanwe ndụ. Ngwóngwó na ihe tara akpụ̀ nà-eduba na emeghị ihe ọbụla na ahụ mkpọnwụ, ebe ịdị mfe na nlekwasịgidé anya nà-eduba na ịga nke ọma na idòanya. Ihe òfùfè a nke ụbọchị anọ gà-egosi gị otú ị gà-esi wábànyé ruo n'isi nke ebumnuche gị iji nwetá otu okwu ọhụụ maka afọ.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Jon Gordon, Dan Britton, na Jimmy Page maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.getoneword.com