Ịhụnanya na Alụmdi-Na-NwunyeIhe Nhụchatụ

Chineke enyeghị anyị atụmanya na ọrụ gasị n'ime alụmdi na nwunye iji mebie nnwere-onwe anyị. Ọ chọrọ naanị ka anyị mara ụzọ ndụ kachasị mma. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a banyere ịhụnanya, nkwanye ùgwù, na nrubeisi adịghị ekwekọ mgbe nile n'echiche nke oge a ma ọ bụ omume ọgbara ọhụrụ, ma anyị pụrụ ijide n'aka na Onye malitere alụmdi na nwunye maara otú Ọ ga-esi mee ka ọ na-aga nke ọma. Mgbe unu gụchara akụkụ Akwụkwọ Nsọ a n’olu dara ụda, kparịtanụ banyere akụkụ ya nke kasị sie ike ighọta ma ọ bụ itinye n’ọrụ. Kpekọọnụ ekpere ọnụ ka Chineke duo onye ọ bụla n'ime unu ka ọ rụzuo ọrụ Ọ họọrọ maka gị n'ụzọ ga-ewetara Ya otuto na nsọpụrụ nye nwunye ma ọ bụ di gị.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Site n’ilekwasị anya n’alụmdi na nwunye anyị site n'ihe ndị e derè n’Akwụkwọ Nsọ, anyị nà-enye Chineke ohere ikpughè nghọta ọhụrụ banyere mmekọrịta anyị na ime ka njikọ anyị sikwuo ike. Atụmatụ ihe ọgụgụ a nà-egosipụta akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị nlekwasị anya na echiche gasị dị kem kem kwa ụbọchị iji malite mkparịta-ụka na ekpere gị na onye i lụrụ̀ gà n'eme. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị́ ụbọchị ise bụ̀ nkwekọ n'eteghị aka iji nyere gị aka tinye uchu ná mmekọrịta gị dị́ ruo ọgwụgwụ nke ndụ a. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lelee finds.life.church
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ nke Ịhụnanya & Alụmdi-na-Nwunye. Maka ozi ndị ọzọ gbasara Life.Church, gaa na webụsaịtị ha bụ: www.life.church