Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Afọ Atúmanya Gị Mezurù: Ụbọchị Ise Nke Inweta Mkpali Iji Malite Afọ Ọhụrụ Gị N'ụzọ Dị IkeIhe Nhụchatụ

Your Breakthrough Year: 5 Days of Inspiration to Kickstart Your New Year

ỤBỌCHỊ 5 NKE 5

ỤBỌCHỊ NKE ISE – ỌNWỤ NKE NRỌ

Melek Sert dị ime ọnwa ise mgbe ọ gara ụlọ ọgwụ n'ihi oké ọbara n'agba ya na mgbu dị ukwuu o nwerè. Mana ọbara ahụ n'agba ya kwụsịrị e wee kwe ya ka o si n'ụlọ ọgwụ pụọ laghachi n'ụlọ nke ya. Mana ụbọchị n'esote, yana di ya Hasan laghachiri n'ụlọ ọgwụ n'ihi otu ihe ahụ kpatara o jiri bịa na mbụ.

E deberè ya n'ụlọ ọgwụ wee n'enyocha ya mgbe niile ka nwa o bù n'afọ ghara ịpụ. O mecharà mụọ nwa n'oge mana ndị dọkịta gwara ya na nwa ya nwoke ahụ ọ mụrụ, nwụrụ anwụ. Seyhan State Hospital na Turkey nyerè ya akwụkwọ ọnwụ maka nwa ya nwụrụ anwụ na obere akpa eji eli ozu.

Hasan burulà ozu nwa ya nwoke ahụ wee gaa na Herekli Neighbourhood Cemetery iji lie ya. Kà Hasan nọ n'anya ụgbọala ya n'aga yabụ ebe ana eli ozu, ọ nụrụ ka nwa ya nwoke ahụ bidoro bewe ákwá. Ọ kwụsịrị ịnya ụgbọala ya wee mepee akpa ozu ahụ. O yipụrụ jaketị ya, were ya kpuchie na gbaa nwa ya gburugburu ka efè, ma gbalié okpomọkụ ụgbọala ya n'ụzọ kachasị elu.

Ambulans bịara ewee buru nwa ahụ gaa na Adana City Research Hospital ewee nye ya ezigbo ngwọta na intensive care. Nwa ha nwoke ahụ nọ n'ezigbo nsogbu n'ihi ọbara-mgbatu-ala o nwerè. Mana Melek hụrụ na nwa ya nwoke dị ndụ! Aka ya na ụkwụ ya nọ n'emegharị, obi ya nọkwa n'eti.

Ihe nke a merè ka di na nwunye a nọrọ n'akpata oyi. Nwa ha nwoke pụtarà ụwa n'oge n'ezughi ezu, ọ dị ndụ ọ nwụghị anwụ dịka e cherè. Ha si n'obi oké arịrị wee baa na ọñụ ka ọñụ. Nwa ha nwoke dị ndụ, ma ugbu a ekpere ha bụ ka ọ gbakee nke ọma: ka uto ya wee n'aga n'ihu na kà ahụ ike ya zuo okè.

Luk 15:24 n'ekwu sí, "Nwa m nwoke a nwụrụ anwụ, mana ugbu a ọ dịla ndụ ọzọ. O furu efu mana a chọtawo ya ugbu a. Ha ewee bido mewe mmemme n'oké añụrị." N'akụkọ a banyere Nwa Mmefu, ọ nwụghị anwụ n'ezie, mana ọ dị ka nke ahụ o merè n'ihi na o si n'ụlọ nna ya gbapụ. Mgbe ọ laghachiri nna ya zuterè ya n'oké ọñụ n'ihi na nwa ya nwoke “nwụrụ anwụ” a lọtala ụlọ.

Hasan na Melek cherè na nwa ha nwoke anwụọla, Nna nwa mmefu ahụ cherè na nwa ya nwoke anwụọla, na ọ gaghị ahụzi ya anya ọzọ. Anyị nwerè ike inwe ahụmahụ nke nrọ anyị ịnwụ ọ wee dị irè na fuo ụfụ dịka ọnwụ ihe ọbụla ọzọ na ndụ anyị.

Mgbe anyị tụrụ anya otu ihe, kpee ekpere maka ya, ma rụsie ọrụ ike maka ya ka ọ pụta ìhè, ihe emeghị ka anyị tụrụ anya ya, ọ na-adị ka ọnwụ. Akpata oyi mgbu n'awụ anyị n'ahụ, obi n'afu anyị ụfụ, anyị n'erikwa újú maka ya. Mbọ anyị niile na-adị ka ihe efu. Ọ na-adị ka ndụ anyị enweghị nzube ma ọ bụ ebumnuche anyị iji ka n'ebi ndụ n'ụwa.

Mana Chineke nwerè ụzọ O si eweghachite ihe ndị furu efu, na ịkpọlite ihe ndị nwụrụ anwụ. O nwerè ike anyị adịla njikere ili nrọ anyị ahụ, mana Chineke ga-eme ihe n'ụzọ anyị n'apụghị ịkọwa. Nrọ gị ahụ, ebumnuche gị ahụ, ebumnobi gị ahụ, na nzube gị ahụ, anwụbeghị– ha kà dị oké ndụ.

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Your Breakthrough Year: 5 Days of Inspiration to Kickstart Your New Year

Afọ ọhụrụ pụrụ ịbụ afọ ị nwetara ihe ndị ahụ ị n'atụ anya ya. Ihe ndị ahụ i n'atụ anya ha nọ n'akụkụ nke ihe mgbochi ma ọ bụ nsogbu ahụ i cherè ihu afọ gara aga. Afọ a pụrụ ịbụ afọ ị ga-enweta ezigbo ihe oma ahụ ị tụrụ anya kemgbe maka ndụ gị. Atụmatụ ihe ọgụgụ a ga-ekekọritara gị mgbamume na mkpali nke ime mmụọ dị mkpa ka ị nweta iji nwee afọ kachasị dị nma i nweturulà.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele The Fedd Agency maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.rickmcdaniel.com/thisisliving.html