Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Afọ Atúmanya Gị Mezurù: Ụbọchị Ise Nke Inweta Mkpali Iji Malite Afọ Ọhụrụ Gị N'ụzọ Dị IkeIhe Nhụchatụ

Your Breakthrough Year: 5 Days of Inspiration to Kickstart Your New Year

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

ỤBỌCHỊ NKE MBỤ – ATÚMANYÁ GỊ AHỤ MEZURUNÚ

E wuliterè m ụlọ ụka mana ụdị ihe ahụ abụghị maka ndị n'enweghị obi ike. Anyị kwagarà na steeti ọhụrụ wee malite ụlọ ụka anyị site na ezinụlọ iri nọ n'ezukọ na bezmentị anyị. Anyị ji aka anyị degaara ihe karịrị mmadụ puku anọ ozi n'akwụkwọ a pịachirì ofuma ka ha bịa sonyere anyị n'ihe ụka mbụ anyị.

Ka afọ ole na ole gacharà, a kpọrọ m ka m bụrụ onye mbụ ga-ekwu okwu na Nzukọ Gasị ebe ana akụziri ndị mmadụ ka esi atọ̀ na e wulité ụlọ ụka gasị. Aha ozi mkpali m zirì bụ̀ “Mmadụ Ole Na Ole, Ndị Dị Obi Ike, Ndị N'atọ̀ Ma N'ewulité Ụlọ Ụka Gasị." Ha bụ ndị agha pụrụ iche nke ndị agha Chineke. Ịnapụ ekwensu ala na ebe o jisirì ike adịghị mfe mana ime nke ahụ dị oké mkpa ka Alaeze Chineke n'azọ̀ ije n'ọganihu.

Enwere ọtụtụ nsogbu n'oge izizi ana amalite ụlọ ụka mana ọ bụrụ na Chineke ejirí ọtụtụ ndị n'esonyere gọzie gị, aga enwekwa nsogbu ọhụrụ gasị. Ebe aga n'ezukọ na-abụkarị ihe nnukwu nsogbu. Ịdị n'atufu ego n'akwụ ụgwọ ụlọ ebe anyị n'ezukọ abụghị ihe anyị chọrọ ime ruo mgbe ebighị-ebi, ya mere na ka oge nọ n'aga, anyị chọwarà inwe ụlọ mgbakọ nke anyị.

Anyị tuliterè ego maka ozuzú ụlọ wee malite ịchọ ebe dị mma anyị ga-ègó yabụ ụlọ. Ihe nke ahụ werè anyị ogologo oge ma nye anyị nnukwu ike ọgwụgwụ. Anyị lerè anya na saịtị 25 dị iche iche ma kpebi na ọ dịghị nke ọbụla n'ime ha ziri ezi izú ka ọ bụrụ ụlọ ụka anyị.

Ọ dị anyị oké mkpa ka ihe ịrịba ama mee - ihe si na Chi ga-eme ka anyị nweta ụdị ụlọ nọ n'ebe dị anyị ezigbo mma ma zuo okè maka ụlọ ụka anyị. N'ụwa owuwú na onwunwé ụlọ ụka, ihe kachasị dị mkpa bụ kà ụlọ ụka gị dị n'ebe ndị mmadụ pụrụ ịbatanwù ya, abughi naanị n'ụdị ebe ọdị.

Otu ụbọchị otu nwoke bụ onye ụka m nọ́ n'azụmahịa ụlọ gwara m na o nwerè ike ime ka mụ na onyeisi ndị kachasị n'ịkwalite ọnọdụ ebe gasị na mpaghara anyị, zukọọ. Mgbe mụ na onyeisi ahụ zukọrọ, a jụrụ m ya banyere otu nnukwu ụlọ ha nwere. Ebe ahụ bụ nnọọ ebe m chọrọ ka anyị nwee kemgbe.

Ebe ahụ nọ n'okporo ụzọ wara nnukwu akụkụ anọ nọ nso ebe ìgwè mmadụ na ụgbọala si apụ. E nwerè nha na mpaghara 1000ft dị n'ihu ụlọ a ma ọ nọkwa n'eche ebe mmepe kachasịnu maka obibi ndị mmadụ ihu. N'ụzọ m n'atụghị anya, onyeisi ahụ gwara m na ya ga-eresi m ụlọ ahụ m chọrọ. Ọ gwakwarà m na ọnụahịa ya ga-abụ $348,000 maka saịtị a ọnụahịa ya karịrị $1,000,000!

Anyị nwetarà atúmanyá ahụ dị egwù nke obi anyị ma nke a gbanwekwarà ụlọ ụka anyị n'ụzọ dị ebighị-ebi. N'afọ mbụ kà a kwuwarà ụlọ ụka anyị, ọ fọrọ nke nta ka anyị buo ibu n'ụzọ abụọ karịa ka anyị dị na mbụ. 1 Ihe E Mere 14:11 na-agwa anyị si, “Devid kwuru si, 'E merirì m ndị iro m n'ihi na Chineke gbawapụrụ̀ n'ime ha dịka oké mmiri n'achi achi' ya mere o jiri kpọọ ebe ahụ “Onye-nwe-anyị Chipụrụ Ndị Iro M Ka Idè."

Chineke pụrụ inyekwa gị atúmanyá ahụ dị obi gị oké mkpa. Mgbe ọ ga-eme, ọ ga-adị ka iju mmiri nke ngọzi dị ebube. Ọ dị mkpa ka i jiri obi gị niile rịọ Chineke maka ya... ma ọtụtụ oge, ihe ahụ ị n'arịọ nwere ike iwe ogologo oge karịa ka ị chọrọ, tupu o mee. Mana Chineke ga-eme ya, ihe ahụ ị n'atụ anya ya ga-eme, ndụ gị ga-agbanwekwa n'ụzọ dị nnukwu ebube.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Your Breakthrough Year: 5 Days of Inspiration to Kickstart Your New Year

Afọ ọhụrụ pụrụ ịbụ afọ ị nwetara ihe ndị ahụ ị n'atụ anya ya. Ihe ndị ahụ i n'atụ anya ha nọ n'akụkụ nke ihe mgbochi ma ọ bụ nsogbu ahụ i cherè ihu afọ gara aga. Afọ a pụrụ ịbụ afọ ị ga-enweta ezigbo ihe oma ahụ ị tụrụ anya kemgbe maka ndụ gị. Atụmatụ ihe ọgụgụ a ga-ekekọritara gị mgbamume na mkpali nke ime mmụọ dị mkpa ka ị nweta iji nwee afọ kachasị dị nma i nweturulà.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele The Fedd Agency maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.rickmcdaniel.com/thisisliving.html