Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Gịnị Bụ Ezi Ịhụnanya?Ihe Nhụchatụ

What Is True Love?

ỤBỌCHỊ 4 NKE 12

Nzaghachi Anyị Nye Oziọma

N'agbanyeghị otú ị si mara ozi ọma nke ọma ma ọ bụ na ị maghị ya, were ihe odide ma jiri nwayọọ na ikpe ekpere na-atụgharị uche n'ozi ọma. Anyị ahọpụtala akuku Akwụkwọ Nsọ na ebe ọgụgụ ga-enyere gị aka na nke a. Rịọ Onye-nwe-anyị ka Ọ webata ozi-ọma n'uche gị na obi gị n'oke idoanya, ike na obi nwayọọ.

Anyị chọrọ ịhụ Jizọs na aja Ya na hụ obi anyị na onwe anyị dịka Chineke si ahụ ha. Anyị achọghị ka a ghọgbuo anyị. Ozi-ọma abụghị nanị mmega ahụ́ amamihe; ọ bụ ihe dị mkpa a na-akọ nke obi.

Tụlee maka ike ozi-ọma na ndụ gị na mmetụta ọ na-enwe n'ahụ gị. Gaa n'ihu na-eme nke a n'ime ụbọchị ole na ole sochirinụ. Mgbe ị mechara nke a, leba anya na kalenda gị ma tinye akara n'ụbọchị na oge, otu izu site ugbu a, mgbe ị nwere ike iji nkeji 15-20 na-ekele Chineke ma na-enwe obi añụrị n'ihe niile Ọ meworo na ndụ gị site n'ozi ọma.

Dị ka ị na-atụgharị uche n'ozi ọma, hụ na ị na-agwa onwe gị eziokwu na ọ nweghịkwa ihe ị na ezoro Onye-nwe-anyị. Gwa Ya ebe ị nwere obi abụọ, ajụjụ, enweghị mmasị, obi siri ike, mmetụta nke enweghị mmasị, ma ọbụna ekweghị ekwe n'ozuzu Ya. Ọ nweghị ihe anyị ga-atụ egwu mgbe anyị nọ na Kraịst. Ọ kwere anyị nkwa na ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, Ọ dị nkwesị ntụkwasị obi ịgbaghara anyị (1 Jọn 1:9).

Igodo: ụbọchị_anọ ụbọchị_anọ

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

What Is True Love?

Onye ọ bụla chọrọ ịma ihe ịhụnanya bụ̀ n'ezie. Ma ọ bụ̀ mmadụ ole na ole nà-ele ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara ịhụnanya anya. Ịhụnanya bụ otu n'ime isi okwu nke Akwụkwọ Nsọ na omume kacha mkpa nke ndụ Ndị Kraịst. Atụmatụ ihe ọgụgụ a siteré na Thistlebend Ministries nà-enyocha ihe ịhụnanya pụtarà na Akwụkwọ Nsọ na otù a gà-esi hụ Chineke na ndị ọzọ n'anya n'ụzọ ka nma.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Thistlebend maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.thistlebend.org