Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Gịnị Bụ Ezi Ịhụnanya?Ihe Nhụchatụ

What Is True Love?

ỤBỌCHỊ 12 NKE 12

Isi Njedebe

N'iburu n'uche ihe niile anyị gụrụ ma mụọ na tụgharịa uche n'ọtụtụ ụbọchị gara aga, ọ na-agụsi gị agụụ ike ịmata ezi ịhụnanya na ịhụ Onye-nwe-anyị n'anya?! Onye-nwe-anyị di anyị mkpa. Ọ bụ naanị Ya ga-egosi anyị ihe ezi ịhụnanya bụ na otú anyị ga-esi hapụ mmehie nke yiri ka ọ̀ na-arapara nnọọ n’ahụ́ anyị. Ịhapụ odinma nke onwe onye na igbu anụ ahụ bụ ọrụ a ga na-arụ ruo ọgwụgwụ ndụ. Ọ pụtara na KWA ỤBỌCHỊ anyị ga-ahapụrịrị ụzọ anyị ma 'jiri okwukwe na-eje ije'. Anyị kwesịrị ịdị n'eme Itinye Eziokwu N'Obi na Ime Ka Ọ Di Ìhè N'Ndụ Kwa Ụbọchị. Anyị ga-ewepụrịrị ụgha nke anụ arụ, ekwensu, na ụwa ma yikwasị eziokwu nke Okwu Chineke site n’ike nke Mmụọ Nsọ. Ka anyị na-amụtakwu ịchụpụ ntụsara ahụ na ụzọ nke ụwa a, ka anyị ga-enwe ike ịnụ ụtọ ọñụ na ọnụnọ nke Kraịst, na ka anyị na-enwekwu agụụ maka Kraịst. A ga-agbanwe anyị site na mmeghari nke uche na obi anyị. Anyị ga-achọ ịhapụ ụzọ ochie anyị wee rapara na nkasi obi na ụzọ nke Kraịst ma mara ezi ọñụ na ezi ihe ụtọ nke ezi ịhụnanya. Anyị ga-ahụ ịhụnanya Ya n’ime anyị na site n’anyị wee mezuo nzube Chineke maka anyị dị ka ekwuru nke ọma na Westminster Catechism: Gịnị bụ isi ọgwụgwụ nke mmadụ? Isi njedebe nke mmadụ bụ inye Chineke otuto na ịnụ ụtọ Ya ruo mgbe ebighị ebi.

Ka anyị kpee ekpere, "Ahụrụ m gị n'anya Onye-nwe-anyị, n'ihi na Ị na-anụ olu m na arịrịọ m maka ebere. Awụsawo ịhụnanya gị n’ime obi m site na Mmụọ Nsọ nke e nyeworo m. Daalụ, Onye-nwe-anyị.”

Iwere Eziokwu Tinye N'Obi:
Họrọ Akwụkwọ Nsọ site n'ụbọchị taa ị ga-ewere tinye n'obi.

Ime Ka NHỌRỌ ODINMA NKE ONWE ONYE nwụọ:
Kedu mmehie a na-ekwu maka ya na ndụ gị site n'Akwụkwọ Nsọ nke i detụrụ.

Ime Ka Eziokwu Pụta Ìhè Na Ndụ:
Olee Ntụgharị kpọmkwem dị gị mkpa ị ga-eme n'ime echiche gị ma ọ bụ mkparama àgwà gị ma ọ bụ omume gị ị nyefe Chineke?

Igodo: ubọchị_Iri na abụọ ubọchị_Iri na abụọ

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

What Is True Love?

Onye ọ bụla chọrọ ịma ihe ịhụnanya bụ̀ n'ezie. Ma ọ bụ̀ mmadụ ole na ole nà-ele ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara ịhụnanya anya. Ịhụnanya bụ otu n'ime isi okwu nke Akwụkwọ Nsọ na omume kacha mkpa nke ndụ Ndị Kraịst. Atụmatụ ihe ọgụgụ a siteré na Thistlebend Ministries nà-enyocha ihe ịhụnanya pụtarà na Akwụkwọ Nsọ na otù a gà-esi hụ Chineke na ndị ọzọ n'anya n'ụzọ ka nma.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Thistlebend maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.thistlebend.org