Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

EKERESIMESI: Mmezù Atụmatụ Chineke Maka NnapụtaIhe Nhụchatụ

CHRISTMAS: God's Rescue Plan Realised

ỤBỌCHỊ 4 NKE 14

Gịnị ka Meri ịbụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke pụtara? Gịnị mere o ji dị mkpa?

Onye edemede ozi ọma, bụ́ Luk, maara na site n’ikwusi ya ike na Meri bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, ọ ga-azaghachi ihe atọ bú ụzọ̀ na-emegide Ụzọ Kraịst:

  1. Ọ ga-aza mmegide si na ndị Juu n'ekwu na Kraịst apụghị iche (Ndị Kraịst na-ekwu na amụma dị n'Aịzaya 7:14: 'Nwa agbọghọ ahụ n'amaghị nwoke ga-atụ ime wee mụọ nwa nwoke, a ga-akpọ Ya Immanuel,' bụ amụma e burù maka Jizọs.).
  2. Ọ ga-aza nkwenkwe Docetic nke kụziri na Jizọs abụghị mmadụ n'ezie. (Nzaghachi Luk mere ka o doo anya na ọ bụ nwanyị mụrụ Jizọs).
  3. Ọ ga-azaghachi nkwenkwe Adoptionist nke kwuru na Jizọs abụghị onye pụrụ iche ruo mgbe Chineke ‘nabatara Ya’ mgbe ọ bụ okenye.

N'ikwu ya n'ụzọ ọzọ, ọmụmụ Jizọs sité na nwaanyị n'amaghị nwoke na akuzi na Jizọs pụrụ iche, bụ mmadu, na bụrụ onyinye nke Chineke kwadororị̀ inye ụmụ mmadụ.

Ma si n'ụzọ n'enweghị atụ: site n'ịhazi ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke mụọ Mezaya ahụ, Chineke haziri ka ihe na-ekweghị omume mee site n'ọrụ nke Mmụọ Nsọ Ya.

Ọ ka n'eme otu ihe ahụ taa.

Ekpere

Ezigbo Nna,

Ọ na ama m obi jijiji ichè n'echiche na m bụ nwa Gị, Gị bụ́ Onye sité na Ya ihe niile na-ekwe na dị omume.

A na m enye Gị nsọpụrụ maka ihe ùgwù nke a, na-arịọkwa Gị ike ka m jiri mezuo nzube Gị maka ndụ m.

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

CHRISTMAS: God's Rescue Plan Realised

Chi ụgha ihe a kpọrọ mmadụ chepụtarà iji kọwaa chi ha maarà na ọ ghaghị ịdị, dị nnọọ ka ụmụ mmadụ mepụtarà ha. Ha bụ̀ chi ndị eji ife òfùfè na inye ihe rịọ ka ha legodi anyị anya. Mana Chi ahụ naanị Ya bụ̀ Ezi Chi ebula ụzọ malite wee na-achọ anyị––ịnapụta anyị wee kpọghachi anyị azụ na Onwe-Ya. Nke ahụ bụ akụkọ Ekeresimesi.

More

Otù Akwụkwọ Nsọ Nke Australia