EKERESIMESI: Mmezù Atụmatụ Chineke Maka NnapụtaIhe Nhụchatụ

Gịnị mere Chineke jiri zipụ nwa Ya nwoke ka a mụọ Ya n'obodo a na-amaghị ama n'ime mba ndị iro wakpọrọ̀ wee jiri aka ike n'achi? Gịnị mere Chineke jiri ji nwa agbọghọ dara ogbenye na nwoke kapinta rụọ ọrụ? Gịnị kpatara ejiri mụọ Ọkpara Chineke n'ebe a n'enye ụmụ anụmanụ nri?
Nke bụ́ eziokwu bụ: Chineke ji nlezianya tọọ atụmatụ maka ihe ndị a merenụ ogologo oge gara aga. Ndị amụma Agba Ochie burù amụma maka ya. Prọfet Micah (5:2-4) burù amụma gbasara nwaanyị ga-amụ nwa eze siteré na agbụrụ dị oké ochie, Onye ga-achị ndị Ya dịka onye ọzụzụ atụrụ, aga amụkwa Ya na Betlehem.
Mgbe afọ narị asaa gachara, kpakpando duuru ndị Mejai ahụ gaa Jeruselem, bụ́ ebe ha jụrụ eze Herọd ebe a ga-amụ ‘eze ndị Juu’.
Ndị odeakwụkwọ lebara anya n’amụma Agba Ochie wee gwa ndị Mejai ahụ na a ga-amụ Mezaya ahụ… kwachaa akpịrị gị, ka m gwa gị: na Betlehem.
Oge kwa oge gara aga, Chineke ji nlezianya tọọ atụmatụ Ya… ịbịakwute gị.
Ekpere
Nna M Chineke,
Ị tọrọ ntọala maka atụmatụ Gị jupụtara n'ịhụnanya oge kwa oge gara aga. Okwu Gị sikwa na Ị bụ Chi na-adịghị agbanwe agbanwe.
Ana m ekele Gị n'ihi na m nwere ike ịdabere wee nwee ahụ iru ala na ịhụnanya ná agbanwebeghị na akụkọ akọtụrụlà nke ụmụ mmadụ.
Lee isiala m nye Gị Nna M.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Chi ụgha ihe a kpọrọ mmadụ chepụtarà iji kọwaa chi ha maarà na ọ ghaghị ịdị, dị nnọọ ka ụmụ mmadụ mepụtarà ha. Ha bụ̀ chi ndị eji ife òfùfè na inye ihe rịọ ka ha legodi anyị anya. Mana Chi ahụ naanị Ya bụ̀ Ezi Chi ebula ụzọ malite wee na-achọ anyị––ịnapụta anyị wee kpọghachi anyị azụ na Onwe-Ya. Nke ahụ bụ akụkọ Ekeresimesi.
More