Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ministrị Nke Èmém Na Àdím Mma N'ogo Kasị OgoIhe Nhụchatụ

The Ministry Of Excellence

ỤBỌCHỊ 3 NKE 3

Emeghị Ihe Nà Adịghị Mma N'ogo Kwesịrị Ekwesị: Ọdịdà Nke Ịhụnanya

Mgbe a jụrụ Jizọs iwu kachasịnu, Ọ zara, sị: “Hụ̀ Onye-nwe-anyị Chineke gị n’anya… na...hụ̀ onye agbataobi gị n’anya dị ka onwe gị." Dị ka anyị hụrụ ụnyaahụ, ịrụ ọrụ dị mma n'ogo kachasịnu bụ otu ụzọ anyị si emezù iwu Jizọs nyerè ka anyị hụ Chineke n'anya site n'ikpughe àgwà nke ịdị mma Ya nye ndị gbara anyị gburugburu. Ka anyị gà-ahụ taa, ịdị mma n'ogo kachasịnu dịkwa mkpa maka idobe iwu nke abụọ n’ọrụ anyị.

Dị ka Ndị Kraịst, anyị enweghị ike ịsị na anyị nà-achọ ịhụ ndị agbataobi anyị n'anya dị ka onwe anyị ma na-arụ ọrụ anyị n'ụzọ gọ̀lịị. Chegodị banyere onye dọkịta bụ́ onye nkè Kraịst. Ọ bụ̀ ezie na dọkịta ahụ nwerè ike kpeere ndị ọ na-agwọ ọrịa ekpere, kesaara ndị ya na ha n'arukọ ọrụ Oziọma, ma nyekwa chọọchị ya ego, mana ministrị ya kacha mkpa bụ̀ ịbụ ezigbo dọkịta. Ọ bụrụ na ọ bụ̀ onye n'adịghị etinye ume n'ọrụ aka ya, ndụ ndị ọ na-agwọ ọrịa nwerè ike ịnọ n'ihe ize ndụ. Ọrụ mbụ dọkịta na-arụ n’ọrụ ya kwesịrị ịbụ ministrị nke ịrụ ọrụ n'ụzọ kachasị dị mma— ilekọta ndị ọ na-agwọ ọrịa ya otú ọ maarà nke ọma, ná-enyé ha otu nlezianya ahụ ọ gà-atụ anya ya na ezinụlọ nke ya gà enweta.

Ugbu a, maka ọtụtụ n'ime anyị, nkà nke ọrụ anyị n'arụ nwerè ike ọ gaghị abụ ihe dị n'etiti nzọpụta ndụ mmadụ ma ọ bụ ọnwụ ya. Mana anyị niile nwerè ohere irube isi n’iwu Jizọs nyerè ka anyị hụ ndị agbataobi anyị n’anya dị ka onwe anyị site n’ịhọrọ ịrụ ọrụ magburu onwe ya na ịgafe ụkpụrụ kacha nta a chọrọ n’ọrụ anyị. Ihe Matt Perman na-ekwu n'isiokwu a atọ́gbuola m: "Ọrụ á ná-ejighị obi mee dịka imebi ihe, n'ihi na ọ na-eme ka ndụ siere ndị mmadụ ike — dị ka mmebi ihe si eme. Ndị òtú Kraịst ekwesighi ịbụ ndị na-emebi iwu ma ọ bụ ndị umengwụ n’ọrụ ha. Anyị kwesịrị ịrụ ọrụ anyị etụ ọ gà-esi nwe mmetụta mara mma nà ndụ ndị ọzọ karịa ime ihe òtù ọbụla anyị si chọọ. Ịdị mma n'ọrụ anyị bụ̀ n'ezie ụdị mmesapụ-aka na ịhụnanya, ma àgwà ịrụ ọrụ n'ụzọ ọjọọ bụ̀ ụdị anyaụfụ na ịchọ ọdịmma naanị otu onye. Ọrụ á ná-ejighị obi mee abụghị naanị ihe ọjọọ, ọ bụ̀ enweghị ịhụnanya.

Dị kà ndị òtú Kraịst, anyị ekwesịghị ịrụ ọrụ dịrị anyị sọọsọ maka ụgwọ nweta dị nà ya. Ọbụrụ na anyị kwenyerè na ọrụ anyị bụ ọkpụkpọ-òkù sitere na aka Chineke, anyị gà-eji “obi anyị na-arụ ọrụ, dị ka ndị na-ejere Onye-nwe-anyị ozi (Ndị Kọlọsi 3:23)," ná-achọ́ inye Chineke otito na ịhụ ndị ọzọ n'anya nke ọma site na ịdị mmá kachasị akasị n'ihe ọbụla anyị n'eme ma ọ bụ ihe anyị bù. Ịdị mma n'ọrụ anyị ekwesighi ịbụ naanị ụzọ esi enweta uru. Ịdị mma n'ogo kasịnụ bụ ụdị ministrị anyị kacha mkpa n'ọrụ anyị. Ka eziokwu a ná-agba gị ume ilekwasị anya n'ịchụso aka ọrụ gị ofụma, ma na etolite n'ịdị mma nke ukwuu maka otuto Chineke na ọdịmma nke ndị ọzọ!

Ọ bụrụ na ọgụgụ atụmatụ ihe ọgụgụ a tọrọ gị ụtọ, ihe òfùfè m n'ede kwà izu gà-amasịkwa gị, n'enyere gị aka ijikọkwu Oziọma n'ụzọ dị omimi n'ọrụ gị. Debanye aha gị ebe a.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

The Ministry Of Excellence

E nwerè ọtụtụ ezi ihe dị na anyị ịchụso ịdị mma n'ogo kasị ogo n'ọrụ anyị: Imé ihe ọbụla otú a nà-akwalite àgám-ihu ọrụ anyị họọrọ ịrụ na ndụ, ọ na-enye anyị ụba nke ọmụma mara mma na dị ogo n'ebe ndị mmadụ nọ, ma nwee ike iduga n'ohere gasị iji kesaa Oziọma. Ma dị ka atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị atọ gà-egosi, anyị kwesịrị ịchụso ịdị mma n'ogo kasị ogo maka ihe dị mkpa karịa—n'ihi na ịdị mma n'ogo kasị ogo bụ̀ ụzọ kachasịnu anyị si egosipụta àgwà nke Chineke na ịhụnanya na ilekọta ndị agbata obi anyị dịka onwe anyị site n'ọrụ anyị họọrọ.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Jordan Raynor maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://www.jordanraynor.com/excellence