Ministrị Nke Èmém Na Àdím Mma N'ogo Kasị OgoIhe Nhụchatụ

N'ekwusa Ịdị-mma N'ogo Kasị Elu Gasị Nke Chineke
Ebumnuche nke eji kènyé anyị ọrụ adịghị iche na ebumnuche nke eji kee anyị, ya bụ̀ inye Chineke otuto n’ihe niile anyị na-eme (1 Ndị Kọrịnt 10:31). "Ịnye Otuto" bụ̀ ihe ndị mmadụ bù n'ọnụ mgbe ọbụla nke kpatara na nkọwa ya adịghịzi mfe. Dị ka John Piper na-ekwu, inye Chineke otuto pụtara nanị “igosipụta ịdị-ukwu Ya” ma ọ bụ̀ ikpughe àgwà Ya nye ndị ọzọ.
Ya merè, ọ bụrụ na ebumnobi nke ọrụ anyị bụ ikpughe àgwà nke Onye-nwe-anyị nye ụwa, gịnị bụ njirimara Ya? Akwụkwọ Nsọ na-akọwa Chineke n'ọtụtụ ụzọ, ma eleghị anya, ọ bụ àgwà Ya nke ịdị-oké-mma kachasịnu n'okikè ka anyị na-ahụ nke ọma. Ị pụghị ilepụ anya na Grand Canyon ma ghara ịnwe nju anya na ọmarịcha ọrụ nke Chineke a. Ị pụghị ịga n'ebe ana edebe anụmanụ n'enweghị ekele maka ịdị elu okike nke Onye Okike. Ị nweghịkwa ike ijide aka nwa ọhụrụ ma anya gị aghara itapara na oké ịdị mma dị n'okike nke Onye-nwe-anyị ime ka ibéribé na ibéribé akụkụ gasị mmadụ gwakọta ọnụ wee ghọọ ndụ n'ekù ume ahụrụ anya. Dị ka anyị hụrụ n’amaokwu nke ụnyaahụ, àgwà ịdị mma n'ogo kasị elu nke Chineke nwụkwarà ka ọkụ n’ime ndụ Jizọs mgbe Ọ nọ n’ụwa, ná-atụ́ ndị Ya na ha dịkọrọ ndụ n’anya na “O mewo ihe nile nke ọma." Anyị na-efe Chineke kasịnụ. Chineke zuru okè. Naanị "Ịdị Mmá N'ogo Kasịnu N'ihe Niile" a pụghị ịkọwacha Chineke anyị, Ya bụ́ Onye kere ihe niile. Mana ọ bụ nkọwa a kacha ekwe anyị bụ́ ụmụ mmadụ nkịtị ịghọta na ibi ka ndụ.
Dị ka ụmụ Chineke, a kpọrọ anyị ka anyị bụrụ ndị na-egosiputa ụdị obibi ndụ nke Nna anyị pụrụ iche. Na Ndị Efesọs 5:1, Pọl na-agwa ndị ụka "dị ka ndị Chineke hụrụ n'anya" ka ha "na-egosiputa omume nke Chineke." N’ikwu okwu banyere amaokwu a, ọkà mmụta okpukpe Andreas Köstenberger na-ekwu si, “Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume nye ịdị mma n'ogo kasinụ nke Chineke? Na nkenke, anyị kwesịrị ịchọ inomi omume Ya... Dị ka ụmụ Chineke agbapụtara, anyị gà-agbalịsi ike ịdị ka Chineke. Nke a gụnyerè ịgbalịsi ike ịdị mma n'ogo kasinụ n'ihe niile." John Piper kọwara ya otú a: "Na Chineke kerè mụ ma kee gị, ka anyị wee jiri ihe niile dị na ndụ anyị wee gosipụta ọdị mma Ya pụrụ iche n'ime ihe ọbụla anyị jị ndú eme."
N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, anyị nà-enye Chineke otuto mgbe anyị nomiri àgwà Ya nke ịdị mma n'ogo kasinụ n'ihe niile, ma n'ime otú ahụ “n'ekwusa ịdị mma nke Onye ahụ kpọpụtara anyị n’ọchịchịrị baa n’ìhè Ya dị ebube” (1 Pita 2:9). Anyị bi n'ụwa ọchịchịrị gbara gburugburu nke na-achọsi ihe magburu onwe ya na eziokwu ike. Ma eleghị anya, o nweghị “akụkụ nke ndụ” anyị dị oké mkpa anyị nwerè igosipụta ìhè nke Kraịst karịa n'ọrụ anyị họọrọ. Mgbe anyị na-arụ ọrụ nke ọma n'ogo kasinụ, anyị na-esi n'ụzọ ahụ ekwusa ịdị mma Chineke n'ogo kasinụ n'ihe niile nye ụwa gbara anyị gburugburu. Pụọ ezi ma rụọ ọrụ gị nke ọma n'ogo kasinụ taa!
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

E nwerè ọtụtụ ezi ihe dị na anyị ịchụso ịdị mma n'ogo kasị ogo n'ọrụ anyị: Imé ihe ọbụla otú a nà-akwalite àgám-ihu ọrụ anyị họọrọ ịrụ na ndụ, ọ na-enye anyị ụba nke ọmụma mara mma na dị ogo n'ebe ndị mmadụ nọ, ma nwee ike iduga n'ohere gasị iji kesaa Oziọma. Ma dị ka atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị atọ gà-egosi, anyị kwesịrị ịchụso ịdị mma n'ogo kasị ogo maka ihe dị mkpa karịa—n'ihi na ịdị mma n'ogo kasị ogo bụ̀ ụzọ kachasịnu anyị si egosipụta àgwà nke Chineke na ịhụnanya na ilekọta ndị agbata obi anyị dịka onwe anyị site n'ọrụ anyị họọrọ.
More