Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mgbe Okwukwe Darà Mbà: Ụbọchị Iri Nke Ịchọta Chineke N'ime Onyinyo Nke Obi AbụọIhe Nhụchatụ

When Faith Fails: 10 Days Of Finding God In The Shadow Of Doubt

ỤBỌCHỊ 2 NKE 10

Gịnị ka ọ pụtara ma ọ bụrụ na ihe m na-ekwu, ihe m na-eche ma ọ bụ ihe m n'eme ezighị ezi?

Ụfọdụ na-akọwa ajụjụ ahụ dị ka ọgụ megide okwukwe. Ma gịnị ka ọ ga aputa ma ọ bụrụ na oge a bụ ohere kasịnụ nke okwukwe? Ọ dị ka aga ama anyị aka ka e wee nyochaa echiche na nkwenkwe anyị ma mee ka ha dị ọhụrụ. Ma eleghị anya nrụgide ndị anyị na-enwe dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs bụ izụlite amara maka ndị na-agbasi mbọ ike ikwere, na ịmepụta ohere maka okwukwe nke gbasikwuru ike, nke metụtara omenala iji too.

N’akụkọ ihe mere eme, ndị nke Chineke achọtawo olu ha n’ala ọzọ. Ọ bụ otu ahu ka esi dee ọtụtụ akụkọ di na Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụ otu mgbanwe si amalite. A mụrụ njirimara onwe n'ime nhụjuanya nke mwepu. Ma ozugbo achọpụtara njirimara onwe, opuru iche ya, ịdị iche ya, na ịma mma nke akụkọ ya na adighị ka nke ndi ozo na-adọta ụwa nke na-ekweghị ekwe laghachi n'onwe ya.

Ọ bụrụ na nke ahụ bụ eziokwu, ọ pụtara na anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ mgbe ụwa na-etinye obi abụọ n’ihu anyị. Ọ dịghị ihe anyi ga-atụ egwu. Ọ dịghịkwa ihe ga-atụ anyi egwu mgbe anyị zutere obi abụọ n'ụdị ọ bụla, ma ọ bụ site na ebe ọ bụla. Ma ọ bụ nrụgide nke ọdịbendị, ọnọdụ nhụjuanya nke ndụ, mgbanwe nke mmetụta uche, ihe mgbu n'ito eto nke nguzobe ime mmụọ, ma ọ bụ ụfọdụ iwe ezoro ezo, mgbe obi abụọ kwụsịrị njem gị, ọ dị mkpa ka ị ghọta na ọ nwere ike ime ka ị gaa n'ihu n'ụzọ ịna enwebeghị ike iga n'mbụ.

Obi abụọ abụghị njedebe nke akụkọ ana akọ; ọ bụ ihe amaghị ama di n'ime ya. Obi abụọ bụ ihe omimi a na-atụghị anya ya; ajụjụ a na-edozibeghị, tere aka. Obi abụọ bụ mgbe inọ na nsọtụ oche gị, ihe otita ina-erighị eri nọ ọdụ n'ọnụ gị mepere emepe, gi ji mbo aka gi na-agawasi onye agbata obi gị ogwe aka ya, inweghị ike iwepụ anya gị n'onyonyo n'agbanyeghị na ịchọrọ iwepu anya gi na ya.

Obi abụọ na-amanye gị ka ị tụleghachi akụkọ nke ndụ gị. Gịnị bụ ihe ndi bara uru nye gị? Kedu ihe ị kwenyere n'ezie? Kedu ụzọ ị chọrọ ịga? Dị ka mmiri dị n'etiti ogige abụọ, obi abụọ na-emepụta ohere maka mpụta dị iche iche. Ị nwere ike igwu mmiri gaa n'ebe Chineke nọ ma ọ bụ gwuru gawa ebe ọbula ichoro. Ị nwere ike irute nso nkwenye ma ọ bụ ekweghị ekwe. Nhọrọ bụ nke gị. Obi abụọ adighị njọ ma obu nma; ọ bụ ihe ịjị ya eme bụ ihe dị mkpa.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

When Faith Fails: 10 Days Of Finding God In The Shadow Of Doubt

Ịgba okwukwe na obi abụọ mgba nwerè ike ịdị nnukwu nnoro-onwe na enweghí mmadu. Ụfọdụ nà-ata ahụhụ ná agbachí nkịtị, ebe ndị ọzọ nà-ahapụ nkwenye kpamkpam, n'echè na obi abụọ na okwukwe adịghị nkwekọta. Dominic Done kwenyerè na nke a bụ ma ihe jọgburu onwe ya nakwà nke ana aghọtaghị ofuma. Ọ nà-eji Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ ndị edere ede na-arụ ụka na ọ bụghị nanị na ịjụ ajụjụ bụ ihe kwesịrị ekwesị kama ọ nà-abụkarị ụzọ e si enweta okwukwe bara ụba na nke siri ike. Nyochaa okwukwe na obi abụọ n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele HarperCollins maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://bit.ly/2Pn4Z0a