Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mgbe Okwukwe Darà Mbà: Ụbọchị Iri Nke Ịchọta Chineke N'ime Onyinyo Nke Obi AbụọIhe Nhụchatụ

When Faith Fails: 10 Days Of Finding God In The Shadow Of Doubt

ỤBỌCHỊ 5 NKE 10

Chineke abụghị Chineke nke oghere. Ọ bụ Chineke nke ihe niile. Ihe anyi maara na nke anyi na-amaghị. Ha niile bụ otu Ọ siri mee ha. Detụọ ihe niile ị maara gbasara sayensị ma tinye akara ajụjụ na nke ọ bụla ị na-amaghị. Mgbe imechara nke a see nnukwu okirikiri gburugburu ihe niile idere. Nnukwu okirikiri a bụ Chineke. Eluigwe na Ala di mgbagwoju anya, dị omimi ighọta, ma jupụta na ihe omimi n'ihi na Ọ mere ya otu ahụ. Ọ wee nye anyị ya.

Ihe niile bụ nke gị.

Chineke nọ n'ime, gburugburu, n'elu, n'okpuru, karịkwa sayensị. Nchọpụta sayensị anaghị agbagha ịdị adị nke Chineke di ka nghọta ka iPhone si arụ ọrụ agbaghaghi ịdị adị nke Tim Cook. . . .

Nke a di ezigbo mkpa. Sayensị akọwafụụghi Chineke. Kama ọ na-egosi anyị ka Ọ si jupụta n'okike na ka Ọ si maa nma.

Ma gịnị ka ọ pụtara ma ọ bụrụ na ọ yiri ka e nwere esemokwu doro anya n’etiti Okwu Chineke na ụwa Chineke?

Lemie anya nso. Nyochakwụọ. Chọpụtakwụọ. Jụọ ase. Chere. Mụọ ihe. Gụọ akwụkwọ. Jụọ ajụjụ. Di mmeghe n'echiche gị na nyocha gị nke Akwụkwọ Nsọ (ma ọ bụ sayensị) ezighi ezi. Ahapụla okwukwe gị. Ahapụla ihe ị kacha hụ n'anya maka ihe ịna amachaghị. Makụọ ihe ịtụnanya nke amaghị. Nọdụ ala n'ahụ ezụghi oke ahu. Nabata ihe omimi.

N'ihi na, onye maara, enwere ike dozie ihe omimi ahụ otu ụbọchị, ma gi-achọpụta, eleghị anya, ọ dịbụghị esemokwu ọ bụla di.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

When Faith Fails: 10 Days Of Finding God In The Shadow Of Doubt

Ịgba okwukwe na obi abụọ mgba nwerè ike ịdị nnukwu nnoro-onwe na enweghí mmadu. Ụfọdụ nà-ata ahụhụ ná agbachí nkịtị, ebe ndị ọzọ nà-ahapụ nkwenye kpamkpam, n'echè na obi abụọ na okwukwe adịghị nkwekọta. Dominic Done kwenyerè na nke a bụ ma ihe jọgburu onwe ya nakwà nke ana aghọtaghị ofuma. Ọ nà-eji Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ ndị edere ede na-arụ ụka na ọ bụghị nanị na ịjụ ajụjụ bụ ihe kwesịrị ekwesị kama ọ nà-abụkarị ụzọ e si enweta okwukwe bara ụba na nke siri ike. Nyochaa okwukwe na obi abụọ n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele HarperCollins maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://bit.ly/2Pn4Z0a