Mee Njem N'ebughí Nnukwu IbuIhe Nhụchatụ

Ịhapụ Njikwa Ihe Nke Ndụ Gị
Ọnwa ole na ole gara aga, a nọ m n'emezu ihe ọrụ m bịara ịrụ n'ụlọ ụka m. Ọrụ ahụ nyere m obi ụtọ karịa, mana amaghị m ma ọlị ihe ọzọ m ga-eme ma ọ gwuchaa. Anọgidere m na-ajụ (mgbe ụfọdụ na-agwa Chineke) ihe ọzọ m chọrọ ime, ọ̀ dị́ ka Ọ na-azá, mana azịza Ya ana-adị m ka ihe n'enweghị isi. Ya mere, m jiri kpebie n'obi m na anụghị m ihe O kwuru nke ọma.
Ihe niile m kpebiri m chọrọ ime na ndụ dị ka ha n'amipụsi n'aka m. Chineke anaghị eso atụmatụ m mere maka ndụ m ma ọlị!
Nke ahụ mere ka m cheta nne Jizọs. Ihe nke ahụ o dịghị mgbagwoju anya? Ọ nọghị n'aka Meri ime mkpebi ma ọlị na ọ ga-abụ nwa agbọghọ n'alụbeghị dị ga atụrụ ime. O nweghị ikike ikpebi otú di ọ chọrọ ịlụ ga-esi kpasi ya àgwà ebe ọ maara nke ọma na ọ bụghị ya bụ nna nwa o bu n'afọ ya. Ọ pụghịkwanu ikwusi ọnụ ndị mmadụ ka ha ghara ikwu okwu ọjọọ ọbụla banyere ọnọdụ ya, amakwa m na ọtụtụ ndị mmadụ nwere ihe dị iche iche ikwu banyere ihe mere ya.
N'ikpeazụ, ekpebiri m ịhapụ njigidesi-ike ahụ m n'enweghị n'ezie n'ọdịnihu m wee buru ha niile n'aka dị nsape chiliere Chineke. E mere m omume ahụ dịka ihe Meri kwuru—ka ọ dịrị m dịka uche Gị siri dị.
O kwesịghị iju m anya, mana Chineke agbanweghị azịza Ya ndị ahụ niile O nyere m. Ọ nọgidere n'edu m ikwara gaa n'obodo ọhụrụ ebe m na-enweghị ọrụ, ebe m na-enweghị ezinụlọ, ebe m n'enweghị ihe nrutu-aka ọbụla banyere ihe ọzọ m kwesịrị ime, ebe m n'enweghị ebe obibi.
Meri na Josef mere ụdị nje m ahụ mgbe ha gbagara Ijipt, mana nke ha bụ na ha gbara ọsọ ndu ichebe ndụ nwa ha, bụkwa Ọkpara Chineke mụrụ nanị Ya.
Mgbagwoju anya m karịrị akari, mana amalitere m irube isi n'ihe niile Ọ si m mee. Ọzọ, o kwesịghị iju m anya, mana achọtara m ebe m ga-ebi, ndị mụ na ha ga-ebi, ọrụ, na ugbu a abụ m onye isi ndị n'arụ ọrụ ohere n'ụlọ ụka m.
Meri, Josef, na Jizọs nwetekwara enyemaka Chineke n'ebe ha nọ!
Ma ọ bụ ebe obibi na ọnụnọ, ọrụ, ego, ịzụ ụmụ, mmekọrịta mụ na ndị ọzọ, ma ọ bụ ọbụna ihe omume ntụrụndụ na-amasị m—ka ọ bụ̀ na m n'achịkwa ha dum, ọ dịghị mgbe ha na-adaba ma ọlị dịka uche m siri tụọ.
Anọgidere m na-atụgharị, n'epiogharí, na-agbalịsi ike ime ka atụmatụ m niile kwekọọ ka m siri chee, mana ọ kweghị omume. N'aka nke ọzọ, Chineke bụ̀ Ya nwere echiche kachasị mma banyere ihe niile gbasara ndụ m. Ahapụla m ibéribé niile nke ndụ m n'aka Ya site ugba a gaa n'ihu. Ya dị ka O siri chee.
A bụ m Kaelyn, onye hapụrụ ihe niile nke ndụ ya n'aka Chineke
Tụlee: Kedụ ihe nke ndụ gị iji aka dịka ígwè jide? Kedụ ihe obi gị n'amapụ na ọ ga-efunahú gị? Kedụ akụkụ nke ndụ gị ọ dị gị ka azịza Chineke banyere ya enweghị isi na ọdụ? Gịnị bụ nzọụkwụ mbụ gị maka ịhapụ njikwa ihe ọbụla nke ndụ gị?
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

N'oge Ekeresimesi jupụtará n'ihe aga eme-eme, ọtụtụ n'ime anyị na-enwe nsogbu na ntakasị-ahụ nke mmekọrịta ezinụlọ, ego ezughị okè, mkpebi ana echezighị echezi wee mee, na ndakpọ olileanya ihe a tụrụ anya ya. Ya mere gaa n'ihu. Kutú obere ume ndụ. Malite Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a nke Life.Church ka ị wee ghọta na ibu ndị a n'anyigbu anyị nwere ike ịbụ ihe ndị Chineke na-agwaghị anyị ka anyị buru. Ọ́ gaghị́ adị mma ma anyị hapụchaa ibu arụ ndị a? Ka anyị mee njem n'egbughí nnukwu ibu.
More

