Mee Njem N'ebughí Nnukwu IbuIhe Nhụchatụ

Ịhapụ Ihere
Echetara m ya nke ọma. A rịọrọ m otu onye m na-akwanyere ùgwù ka o kpeere m ekpere. Mgbe o jụrụ m ihe ọ bụ maka ya, ihe m nwere ike ikwu bụ na ọ dị m ka ọ̀ dị ihe na-eme m. Dị ka, n'ime ime m, na ihe niile m bụ na mmadụ, na adịghị m nma. A bụ m onye okenye, mana ikwupụta ihe n'enye m nsogbu ekweghị m eme.
Ọ bụ ihere.
Iji mee ka o doo anya, ihe m n'enwe mmetụta ya abụghị ikpe ọmụma. Ikpe ọmụma bụ na i ghọtara na ị mejoolá. Ihere bụ iná eche na ị bụ ihe n'adịghị nma. Nnukwu ihe dị́ iche dị n'etiti ihe abụọ a.
Ihere na-eme ka anyị kwenye na onye anyị bụ n'eziokwu kwesịrị idi nzuzo, n’ihi na ọ dịghị onye chọrọ ịhụ ma ọ bụ ima onye anyị bụ n’ezie. Nke ahụ n'eme ka ezigbo ụjọ tuo anyị mgbe anyị cherè na ihe na otu anyị dị n'ezie bụ ihe Chineke n'ahụ. Nke a bụ kpọmkwem ihe m nọ na-agabiga n'ihi ihe ndị e kwuru ma mee m ogologo oge gara aga. Okwu na omume ndị ahụ tapara m n'ahụ ma miba m mkpụrụ n'ime nke mere ka m jiri ihe asi dị otú ahụ hutawa onwe m.
Ka m tupenye gị eziokwu: Chineke na-ahụ ka anyị dị n'ezie, ihe niile gbasara anyị, ma Ọ ka na-emeghe ogwe aka Ya n'ịhụnanya maka anyị. Mgbe Ọ na-ele anyị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst anya, Ọ na-ahụ ụmụ nwanyị na ụmụ nwoke ndị n'enweghị ntụpọ n'ihi na Jizọs nwụrụ ka O were ọnọdụ ihere anyị. Mụ, anyị, nwere ike ịhapụ ihere anyị wee nabata uru Ọ na-etinye n'ahụ anyị.
Nke ahụ niile dị ezigbo mma, ikwu eziokwu, mana nke a bụ ihe m mụtara. Ịhapụ ihere abụghị ihe a n'eme "n'otu oge". Nye m, mwepụ ihere m dịka ngwugwù ebidoro topụwa nwa obere nwa obere ka m bidoro ghọtawa na ihe ndị ahụ niile m cherè maka m bụ así wee malite ịjụ ha n'otu n'otu. Mgbe m mechara nke ahụ, e burulà m ugha ndị ahụ mafuo ha ebe dị ezigbo anya n'ebe m nọ ka m na-achọpụta ma na-ewepụta eziokwu kpọmkwem sitere n'Okwu Chineke iji dochie ụgha ọ bụla.
Ịhapụ ihere nwere ike ọ gaghị adị ngwangwa, dị mfe, ma ọ bụ bụrụ ihe n'adịghị ara ahụ, mana ọ kwere omume. Chineke ekweteghị ma ọlị así ndị ahụ ị kwenyere gbasara onwe gị, mana Ọ ga-ebupụ ha n'ahụ gị, ọ bụrụ ma i kwe Ya.
A bụ m Amanda, onye kwere ka Chineke si n'ahụ m n'ebupụ̀ ihere
Ihe Ị Ga-eme: Chọpụta ụgha ndị ị kwenyere na ha wee malite ibi ndụ na ikwupụta eziokwu Chineke banyere onwe gị n'elu ha. www.life.church/declarations
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

N'oge Ekeresimesi jupụtará n'ihe aga eme-eme, ọtụtụ n'ime anyị na-enwe nsogbu na ntakasị-ahụ nke mmekọrịta ezinụlọ, ego ezughị okè, mkpebi ana echezighị echezi wee mee, na ndakpọ olileanya ihe a tụrụ anya ya. Ya mere gaa n'ihu. Kutú obere ume ndụ. Malite Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a nke Life.Church ka ị wee ghọta na ibu ndị a n'anyigbu anyị nwere ike ịbụ ihe ndị Chineke na-agwaghị anyị ka anyị buru. Ọ́ gaghị́ adị mma ma anyị hapụchaa ibu arụ ndị a? Ka anyị mee njem n'egbughí nnukwu ibu.
More