Nzọpụkwụ Ọbụla Bụ Nke MbiarụteIhe Nhụchatụ

O Ruru Otu Mgbe
“Oruru Otu Mgbe” bụ ụzọ akụkọ ọma niile si amalite. Ọ bụkwa otú Ndị Kraịst si emeso ajụjụ bụ́ “Ndụ m ọ̀ dị mkpa?” N'ime akụkọ, ndi mmadu ọbụla nọ n'ime akụkọ ahu dị mkpa. Onye ọ bụla nwere ihe ọ pụtara. Ya mere, anyị na-ekwu "Oruru otu mgbe" ma soro jiri okwukwe anyị na obi abụọ anyị, nrube isi anyị na nnupụisi anyị, ofufe anyị na enweghị mmasị. Ihe ndị ahụ niile na ndị ọzọ sokwa n'ime nke akụkọ—akụkọ pụtara ihe.
Ọ bụghị akụkọ niile bụ maka ndị dike. Ọ bụghị akụkọ niile bụ maka njem tụrụ anya. Anyị nwere akụkọ bụ maka ndị dị egwu—akụkọ ndị banyere Jọsef na Mọzis na Devid na Pọl. Ma e nwekwara akụkọ ndị dị ka nke Naomi na Rut na Boaz. Ebe a ihe ana eme bụ ihe ana emenwụ kwa ụbọchị. Ma ihe niile ahụ a na-emenwụ kwa ụbọchị—mbịara mbata, iguzosi ike n’ezi ihe nke Rut nye Naomi, obiọma Boaz nye Rut, nlebara anya n’iwu ahụ—nkọwa ndị a niile bụ ihe ndị so n'akụkọ nke bụ usoro akụkọ di n'ime usoro akụkọ n’ime nnukwu akụkọ nzọpụta nke Chineke. Akụkọ nke pụtara ihe—ma pụtakwa ihe niile.
Naomi banyere n'ime akụkọ a site n'ime mkpesa. Ọ nwetara mfu, mee mkpesa nke ukwuu banyere ya, mee ka onye na-akọ akụkọ were enweghị obi ụtọ ya kpọrọ ihe ma mee mkpesa megide Chineke. Edere amaokwu ndị a n'ụzọ na-egosi na ọ bụ onye nwere mkpesa n'ihu Chineke. Udi ụzọ mkpesa a e debere n'ụdị iwu ka Jeremaya kwukwara, bụ́ onye tinyere aka n'ikpenyere na ikpegbụ n'etiti Chineke na ndị mmadụ. Ọ welitere mkpesa nke ndị mmadụ ma tinye ha n'ikpe megide Chineke; ebubo bụru na Chineke emeghị ezi omume na Ọ kpeghi ikpe ziri ezi.
N'agbanyeghị na ọ dị ka ajọ omume, ọbụlagodi nkwughie ọnụ, ịgwa Chineke okwu otu a, eziokwu doro anya bụ na ọ bụ ihe akwadoro ofụma na Akwụkwọ Nsọ. Site n’ige mkpesa ibe anyị ntị na imepụta ha megide Chineke, anyị na-enyere ibe anyị aka ịbanye n’ime akụkọ. Ọ bụghị mgbe niile ka anyị ga-anọnyere Chineke, na-agbachitere Ya. Enwere oge mgbe ọnọdụ anyị di ka Akwụkwọ Nsọ si gosi dị n'akụkụ onye gbara ibe ya akwụkwọ n'ụlọ ikpe. Site n’ịbụ onye e ji kpọrọ ihe—n'abụghị onye a jụrụ ajụ, n'abụghi onye akụdara n’ala, n'abughi onye emere di ka ihe ọ n'agabiga obu nke ime mmụọ—mkpesa Naomi sooro n'ime akụkọ ahụ nke a n'ako. Ihe mfu nke ndụ ya ka etinyere n'ime usoro akụkọ ahụ ma, ka a n'aga, n'ime oge maka igosipụta nye ihe nke Chineke.
Ị na-ala azụ ikwupụta mkpesa gị megide Chineke? Olee otú akụkọ Naomi nwere ike isi duzie gị n’ịgwa Chineke okwu n’ezoghị ọnụ?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Anyị nwerè olileanya na ihe òfùfè ise ndị a sitere n’aka Eugene Peterson gà-ewega uche gị na obi gị ebe ọbụla ha nwerè ike iga, ebe ọ bụ na ị nweghị ike ima ihe Mmụọ Nsọ gà-eji agba ume ma ọ bụ ịma aka ma ọ bụ ikasi obi. Ị nwerè ike ịhọrọ iji ajụjụ ndị na-atụgharị uche ná njedebe nke ihe òfùfè ọbụla iji mepụta ekpere nke gị maka ụbọchị ahụ—n'ezie a bụghị dị ka ebe njedebe kama dịka mmalite maka ihe ndị bịara abịa ná-eché gị.
More