Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Oswald Chambers: Ọñụ - Ike N'Ime ChinekeIhe Nhụchatụ

Oswald Chambers: Joy - Strength In The Lord

ỤBỌCHỊ 29 NKE 30

Mkpụrụ obi ọ bụla nke na-enweghị ebe naanị ya na Chineke na anọ, nọ n'ime ezigbọte ihe ọjọọ di egwu n'ụzọ ime mmụọ. Ànyị ekwerela ka agbarie ebe inọ naani ndi ahu, ma obu ji ebe nchụàjà dika ha mara nma ruchie ha? Ma ndi mmadu n'agafe ana asi, "Lee ka onye ahu si buru ezigbọ onye ọkpụkpe." Ebe ịchụàjà dị otú ahụ bụ mkparị nye ọrụ omimi nke Chineke n'ime mkpụrụ obi anyị. Chineke nye ka anyị mụta nnukwu na nnukwu maka ọṅụ miri emi nke anyi na Chineke ịnọrọ n'ọchịchịrị nke abalị ma rụọ n'isi ụtụtụ.

N’ime Akwụkwọ Mkpughe, Jizọs Kraịst kpọrọ onwe ya “onye mbụ na onye ikpeazụ.” Ọ bụ n'etiti ka mmadụ nile n'eme nghọrọ ha; mmalite na ọgwụgwụ ihe niile na-anọgide n'ebe Chineke nọ. Iwu Chineke bụ ọmụmụ na ọnwụ, ma n'etiti ókè ndị ahụ ka mmadụ na-eme mkpagbu ma ọ bụ ọṅụ nke ya.

Ajụjụ Ntụgharị Uche: Olee ebe mu na Chineke n'anọ naani onwe anyi? Ọ̀ na-atọ m ụtọ ịnọrọ naanị mu na Chineke ka ọ̀ na-agụsi m agụụ ike igawa ga rụọ ọrụ? Ana m amalite kwa ụbọchị site n’ịjụ Chineke ihe m kwesịrị ime ma jedebe ya site n’ịjụ otú m siri mee?

Okwu ndị ewetara site na Ọ Ga Etọ M na Idikwa Elu Maka Idi Elu Ya Kachasi, nke ndi Nkwụsa Ụlọ Ọrụ Nchọpụta
Ụbọchị 28Ụbọchị 30

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Oswald Chambers: Joy - Strength In The Lord

Chọpụta amamihe nke Oswald Chambers, onye odee nke Nke M Niile Maka Nkachasi Elu Nke Ya, n'ime akụ nke nghọta gbasara ọṅụ. Ọgụgụ ọ bụla na-egosipụta nhọta ndị sitere na Chambers, ya na ajụjụ maka ntụgharị uche nke onwe gị. Ka ọ na-agba gị ume ma na-ama gị aka site n'amamihe ya dị mfe na amamihe nke Akwụkwọ Nsọ di kponkwem, ị ga-ahụ onwe gị na-achọ itinyekwu oge na mkparita uka gi na Chineke.

More

We would like to thank Discovery House Publishers for providing this plan. For more information, please visit: www.utmost.org