Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Oswald Chambers: Ọñụ - Ike N'Ime ChinekeIhe Nhụchatụ

Oswald Chambers: Joy - Strength In The Lord

ỤBỌCHỊ 28 NKE 30

Na mmalite nke ọrụ Ndị Kraịst, ngọzi Chineke bu nnọọ ihe ezi uche, bụrụkwa ihe e ji mmetụta mara, nke mere na Onye Uzo Kraịst na-aga ije na nlemanya karịa site n’okwukwe, mmetuaka Chineke dika ọ dị n’ahụ́ ya. Ma oge na-abịa na ndụ onye na-esọ ụzọ Kraisti mgbe Chineke napụrụ nkasi obi ndị a, mgbe ọṅụ n'ime Chineke abụzikwaghi otú ọ na-adịbu, mgbe ọnụnọ Ya adịghịzi ụtọ, mgbe ihe mgbagwọjụ anya n'enweghi mmasi n'acha ka ntu (ọ bụrụ na mmadụ nwere ike ikwu otu a) dika ọ dakwasịrị ndụ nke ime mmụo.

Na nwa oge a, mkpụrụ obi na-abanye n'oké ọchịchịrị; ma ọ na amalite ịghọta na Chineke na-akụziri ya ihe dị iche n'etiti ije ije n'ìhè nke ngọzi na ịbanye n'ahụmahụ nke ihe ụtọ Chineke; ma ọ bụ, itinye ya n'ụzọ dị mfe karia, Chineke na-ewepụta mkpụrụ obi n'ime mpaghara nke okpụkperechi na nke mmetụta ime obi, tinye ya n'ime alaeze nke okwukwe.

Ajụjụ Ntụgharị Uche: N’ụzọ dị aṅaa ka Chineke si na-akụziri m iga ije n’ìhè nke eluigwe nke ịdị uto nke Ya, karịa n’ìhè akamere nke ngozi nke ụwa?

Nhọta e nwetara site na Ọrụ Aka Nke Chineke, nke Ndi Nkwụsa Ụlọ Ọrụ Nchọpụta

Okwu Chukwu

Ụbọchị 27Ụbọchị 29

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Oswald Chambers: Joy - Strength In The Lord

Chọpụta amamihe nke Oswald Chambers, onye odee nke Nke M Niile Maka Nkachasi Elu Nke Ya, n'ime akụ nke nghọta gbasara ọṅụ. Ọgụgụ ọ bụla na-egosipụta nhọta ndị sitere na Chambers, ya na ajụjụ maka ntụgharị uche nke onwe gị. Ka ọ na-agba gị ume ma na-ama gị aka site n'amamihe ya dị mfe na amamihe nke Akwụkwọ Nsọ di kponkwem, ị ga-ahụ onwe gị na-achọ itinyekwu oge na mkparita uka gi na Chineke.

More

We would like to thank Discovery House Publishers for providing this plan. For more information, please visit: www.utmost.org

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara