Ihe niile dị ndị ụlọ ụka gị mkpa iji wee hụrita ozi gị, gụọ ya, ji ya wee mee ihe, na kesaara ya ndị ọzọ. Nke dị efu, edeghị ya ede n'akwụkwọ, na nke e budatagorì na nde kwa nde ngwaọrụ gasị.
Ndị sonyerenụ nwerè ike iso n'eme ihe, soro na-agụ Akwụkwọ Nsọ, detuo ihe, na ọbụna chekwaa kọpị nke ha ji aka ha hazie maka ntụaka n'ọdịnihu.
Nkọwa ozi gasị, amụma-ọkwa-ozi gasị, njikọ gasị na-eduga n'inye ihe na ịntanetị… ihe ọ bụla ịchọrọ ịgwa ndị ụka gị, kesaa ha niile — 100% n'efu.
Kwado agụmagụ Atụmatụ Ihe Ọgụgụ na Ihe Òfùfè Gasị gá-emé ka ọgbakọ gị na Akwụkwọ Nsọ na-akparịta ogologo oge izu niile.

Mepụta Ihe Mmemme Gasị n'ụzọ dị mfe site na Mac ma ọ bụ PC ejikọrọ na weebụ. Naanị dọrọ-dobe Ihe Mmemme gị nke ọ bụla n'ime otu ebe, na-ahazigharị, na-edezi, na n'atụcha ka ị na-aga.
Modụl gasị dị́ mfe iji wee mee ihe n'eme ka ị ghara itufu oge na ike ọrụ. Gwákọta ụfọdụ ihe gasị ọnụ iji mepụta Ihe Mmemme Gasị ọhụrụ site na mmalite. Ma ọ bụ jigharịa Ihe Mmemme gị Gasị dị adị ugbu a mee ihe ma n'emegharị ha dị ka ọ dị mkpa. Ọbụna kọpịa Ihe Mmemme Gasị dị adị ugbu a wee gbanwee ha ka ha dabara ụdị nnọkọ dị iche iche. Ka ị n'eme ihe ndị a niile, Nhụchatụ na-enye gị ohere ịhụ ọdịnaya Ihe Mmemme gị kpọmkwem otù ndị sonyeere n'ihe gị ga-esi wee hụ ha.
Nkọwapụta gasị, isi ihe gasị, ajụjụ mkparịta-ụka gasị… Kekọrịta ọdịnaya ederede ọ bụla ga-enyeré ndị sonyeere gị n'ihe ụka gị aka isonye nà ká n'ege ntị n'ozi gị ka ọ na-eme.
Gosipụta akụkụ Akwụkwọ Nsọ gasị n'ebe ozi gị nà-ezò aka na ha, jikọtara ha na ụdị nsụgharị gasị 2400+ nke Ngwá Baịbụl, n'asụsụ 1600+ — ọ dịghị mkpa ime mmapị ma ọbụ̀ mmakwasị.
Njikọ na-eduga na Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Nke Akwụkwọ Nsọ na Ihe Òfùfè Gasị nke metụtara isi nkuzi gị gasị, na-enyere ndị na-ege gị ntị aka ịnọgide n'etinye aka na uche n'Okwu Chineke ogologo oge n'ime izu.
Tinye ndị n'ege gị ntị ka ọ dịrị ha mfe ime naanị otu ọpịpị iji wee nye ihe n'ịntanetị, debanye aha ha maka ịrụ ọrụ ohere, ma ọ bụ ịga na hóm peeji gasị nke ụlọ ụka gị. Dèbé kpọmkwem n'ime Ihe Mmemme gị, njikọ ná-edugá na saịtị ọ bụla dị na ezi.
Jìrí nkà n'eme n'usoro n'usoro, foto gasị, Onyonyo Amaokwu Gasị, na ihe ndị ọzọ mee ka Ihe Mmemme gị dị ndụ. Ndị sonyeere gị nwerè ike ikesa onyonyo gasị Ihe Mmemme n'ụzọ dị mfe n'ebe mgbasa ozi ọha nke mmekọrịta ha, n'eme ka ozi gị gazuo ebe niile.
Kesaa n'ụzọ dị mfe ozi gị niile dị ngwa ngwa, dị mkpa: akụkọ banyere ihe n'eme n'ụlọ ụka, ihe mmemme gasị dị na kalenda, ihe mmemme gasị, klaasị gasị, ohere gasị dịnụ maka ọrụ ohere na ije ozi nke izi oziọma, na ihe ndị ọzọ.
Mee ka ndị mmadụ mara ebe na mgbe Ihe Mmemme gị na-eme — ọbụlagodi maka Ihe Mmemme Gasị n'eme na ọtụtụ oge na ebe dị iche iche.
Egbula onwe gị oge ma ọ bụ kwafuo ike ọrụ. Mepụta Ihe Mmemme ọhụrụ gasị ngwa ngwa site na ịkọpi ndị dị adị wee jiri ozi emelitere, gbanwee ha.
Atufulà ego n'imé mbipụta ma jìrí obere pepa ma ị n'eme nke a… ọbụlagodi ka ị na-eseti aka wee n'erute ndị mmadụ na platfọm nwerè mbudata na ntinye karịrị nde 200.


“Obi tọrọ anyị ụtọ itinye YouVersion n’ọrụ na ministrị anyị, karịsịa n’akụkụ Ihe Mmemme Gasị, bụ́ ebe anyị na-etinye ndetu gasị banyere nkụzi emerè na okwu gasị e kwuru banyere ha, nke izu ọ bụla. Ndị anyị dị oké ọñụ n'ihi na ha nwerè ihe odide ndị ahụ n'ọbù aka ha, nwee ike ikesa ha, na ichekwa ha. Anyị eburula dola puku kwa puku nye na tinye-aka n'akụkụ ndị ọzọ nke ministrị anyị nwere mkpa site n'ịkwụsị iji Ihe Mmemme ebipụtara ebipụta!”
Pastor Bill White
Christ Journey Church

"YouVersion Events bụ akụrụngwa bara uru maka ezinụlọ ụka anyị. Ikike ya ime ka ndị anyị n'esonye n'ihe ụka a n'eme jiri ndetụ gasị banyere ozizi a n'eme na Okwu Chineke, n'oge anyị n'ezi ozi Chineke, nà-emepụta njikọ-aka siri ike na mmetụta dị ukwuu."
Pastor Herbert Cooper
People's Church

"Anyị na-eji Ihe Mmemme Gasị eme ihe maka nnọkọ anyị niile, n'enye ndị sonyeere anyị ohere ịnweta ndetu na Okwu Chineke sitere n'aka ndị ọkà okwu kwụ kpọmkwem n'ihu ha. Ihe Mmemme Gasị emeela ka anyị ghara itufu ego n'ibipụta ọtụtụ puku peeji! Ịtọlite Ihe Mmemme dị ezigbo mfe, a na-ebipụtakwa ya kpọmkwem n'oge anyị chọrọ ya.”.
Cindy Beall
Leading and Loving It Director of Equip
Otu Mgbanwe siri-ike ka e si agụ Akwụkwọ Nsọ n'ewere ọnọdụ n'oge ndụ anyị a. Ka e budatara n'ime ihe karịrị nde 750 ngwaọrụ pụrụ iche ruo ugbu a (ma n'aga n'ihu), Ngwá Baịbụl na-enyere ndị mmadụ ná mba ọ bụla n'ụwa a aka ijikọkwu n'Okwu Chineke. Ma ugbu a, site na Mmemme-Gasị, ọbụ ihe obi ụtọ nye anyị iwetere gị nrute-aka nke yabụ platfọm.
Kwadebe Ihe Mmemme gị mbụ ka e mee ya nkesa na Ngwá Baịbụl n'ihe na-erughị nkeji iri. Ihe niile dị mkpa ka ị jiri mee nke a bụ̀ Mac ma ọ bụ PC yana akaụntụ YouVersion dị efu.