II. NDI TESALỌNAIKA 3:2-3 - Compare All Versions
II. NDI TESALỌNAIKA 3:2-3 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka e nwee ike napụta anyị nʼaka ndị ajọ mmadụ, nʼihi na ọ bụghị mmadụ niile nwere okwukwe. Ma Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi, ọ ga-echebe unu ma gbaakwa unu ume ka unu hapụ ịdaba nʼaka ajọ onye ahụ.
II. NDI TESALỌNAIKA 3:2-3 IGBOB (Bible Nso)
ka ewe dọputa kwa ayi n'aka ajọ madu ndi nēmehie kwa; n'ihi na ọ bughi madu nile nwere okwukwe. Ma Onye-nwe-ayi bu onye kwesiri ntukwasi-obi, Onye gēme ka unu guzosie ike, che kwa unu ka unu ghara idabà n'aka ajọ onye ahu.