ỌLU NDI-OZI 4:18-21
ỌLU NDI-OZI 4:18-21 IGBOB
Ha we kpọ ha, nye ha iwu ka ha ghara ikwu okwu ma-ọli ma-ọbu izí ihe n'aha Jisus. Ma Pita na Jọn zara, si ha, Kpenu ma ọ bu ihe ziri ezi n'anya Chineke inu olu-unu kari olu Chineke: n'ihi na ayi onwe-ayi apughi ighara ikwu ihe nile ayi huru nu kwa. Ma mb͕e ha basiri ha nba ọzọ, ha rapu ha ka ha la, ebe ha nāhughi uzọ ha gēsi me ka ha hu ahuhu-nmehie, n'ihi ndi-Ju; n'ihi na madu nile nēnye Chineke otuto bayere ihe emeworo.



