Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara ỌLU NDI-OZI 4:18

Otu Okwu Ga-agbanwe Ndụ Gị
Ụbọchị Anọ
OTU OKWU ná-enyeré gị aka ime ka ndụ gị dị mfe site n'ilekwasị anya nanị n'OTU OKWU n'ime afọ dum. Ịdị mfe nke ịchọpụtà okwu Chineke nwerè maka gị nà-eme ka ọ bụrụ ihe na-akpalite mgbanwe ndụ. Ngwóngwó na ihe tara akpụ̀ nà-eduba na emeghị ihe ọbụla na ahụ mkpọnwụ, ebe ịdị mfe na nlekwasịgidé anya nà-eduba na ịga nke ọma na idòanya. Ihe òfùfè a nke ụbọchị anọ gà-egosi gị otú ị gà-esi wábànyé ruo n'isi nke ebumnuche gị iji nwetá otu okwu ọhụụ maka afọ.

Nrubeisi
Izu Abụọ
Jizọs n’Onwe Ya kwurù na onye ọ bụla hụrụ Ya n’anya gà-erube isi ná nkuzi Ya. N'agbanyeghị ihe ọ nà-efu anyị n'onwe anyị, nrubeisi anyị dị Chineke mkpa. Atụmatụ ihe ọgụgụ nke “Nrubeisi” nà-edu anyị ije site n'ihe Akwụkwọ Nsọ nà-ekwu gbasara nrubeisi: Otú esi akwugidesi ike n'echiche nke iguzosi ike n'ezi ihe, ọrụ ebere ná ndụ anyị, otú nrube isi si eme ka anyị nwere onwe anyị na gọzie ndụ anyị, na ihe ndị ọzọ.