Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara NDI FILIPAI 4:7

Wepụ Ụjọ
Ụbọchị 3
Ị nwerè ike imeri mmetụta ụjọ. Dr. Tony Evans nà-edu gị n'ụzọ nke nnwere-onwe n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a n'enye mmepe anya. Chọpụta ndụ nke añụrị na udo nke ị nà-achọ kemgbe ka ị nà-eme ihe ndị bụ eziokwu n'enweghị mgbaga ewepụtarà n'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a.

Ìhè Nke Ụwa - Ihe Òfùfè Nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa
Ụbọchị Anọ
Ọtụtụ Ndị Kraịst gburugburu n'ụwa gà-eme ememe Ekeresimesi n'afọ a. Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa, ememe ihe atụ mara mma nke na-eduga n'Ụbọchị Ekeresimesi, bụ̀ otu akụkụ ihe buru ibu nke ememe Ekeresimesi n'ọtụtụ mba. Ka ị na-agụ ihe òfùfè a nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa na-akpali obi ụtọ, i gà-enwe ohere isonye ụmụnne gị na ụmụnna gị ndị kwere na Kraịst si mba ndị dị anya mee emume a wee mụta ihe site n'echiche na ọdịnala ha gasị pụrụ iche.

Ibi Ndụ Gbanwere Agbanwe: Nà Ekeresimesi
Ụbọchị Ise
N'ime nkwagharí na nchigharí nile nke oge ezumike, ọ na-adị mfe ịchefù ihe mere anyị ji eme ememe. N’ime atụmatụ ihe ọgụgụ nke amụma-ọkwa-ọbịbịa a dị ụbọchị ise, anyị gà-amikpunye onwe anyị n’ime nkwa ndị e mezurù site na ọmụmụ Jizọs na olileanya anyị nwerè maka ọdịnihu. Ka anyị nà-amụtakwụ ihe gbasara onye Chineke bụ, anyị gà-achọpụta ka anyị gà-esi bie ndụ n’oge ezumike a site n’olileanya, okwukwe, ọṅụ, na udo.

Ibi Ndụ Mgbanwe: Ịnabata Ezi Onye A Bụ̀
Ụbọchị Isii
N'ihi na enwerè ọtụtụ olu na-agwa anyị onye anyị kwesịrị ị bụ́, ọ bụghị ihe ijuanya na anyị n'enwe mgba nke nkọwapụta ezi onye anyị bụ̀. Chineke achọghị ka ọrụ anyị, ọnọdụ alụmdi na nwunye anyị, ma ọ bụ mmejọ anyị kọwapụta ndị anyị bụ̀. Ọ chọrọ ka echiche Ya bụrụ ikike kachasị elu na ndụ anyị. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị isii gà-enyere gị aka ka i tinye n'obi gị, isi gị na uche gị ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu gbasara onye ị bụ̀ na ka i nakwere onye i bụ̀ n'ezie n'ime Kraịst.

Mee Njem N'ebughí Nnukwu Ibu
Ụbọchi Asaa
N'oge Ekeresimesi jupụtará n'ihe aga eme-eme, ọtụtụ n'ime anyị na-enwe nsogbu na ntakasị-ahụ nke mmekọrịta ezinụlọ, ego ezughị okè, mkpebi ana echezighị echezi wee mee, na ndakpọ olileanya ihe a tụrụ anya ya. Ya mere gaa n'ihu. Kutú obere ume ndụ. Malite Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a nke Life.Church ka ị wee ghọta na ibu ndị a n'anyigbu anyị nwere ike ịbụ ihe ndị Chineke na-agwaghị anyị ka anyị buru. Ọ́ gaghị́ adị mma ma anyị hapụchaa ibu arụ ndị a? Ka anyị mee njem n'egbughí nnukwu ibu.

Dị̀ Nchegbu N'efu
Ụbọchị asaa
Gịnị ka ọ gà-apụta ma ọ bụrụ na e nwerè ụzọ ka mma ịlụso nchegbu n'adịghị agwụ agwụ n'eme ka ị ghara ihi ụra n'abalị, ọgụ̀? Ezi ezumike dị—ma nwee ike dị nso karịa ka ị cherè. Jiri udo dochie ụjọ site ná atụmatụ ihe ọgụgụ nke Akwụkwọ Nsọ a dị ụbọchị asaa sitere na Life.Church, na-esote usoro ozi Pastọ Craig Groeschel bụ́ Dị̀ Nchegbu N'efu.

Udo Ahụ N'efunahụ Anyị
Ụbọchị asaa
Ọ̀ gà-ekwe omume n'ezie inwe udo mgbe ndụ jupụtarà na ihe mgbu? Azịza dị mkpirikpi bụ: ee, ma ọ bụghị n'ike nke anyị. N’ime otu afọ nke mere ka ọ dị anyị ka ibu arọ ọ dakwasịrị anyị niile, ọtụtụ n’ime anyị nwerè ajụjụ. N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ nke Akwụkwọ Nsọ a dị ụbọchị asaa, isorò usoro ozi Pastọ Craig Groeschel, anyị gà-ekpughe otù anyị gà-esi chọta Udo Ahụ N'efunahụrụ anyị nke anyị niile nà-achọsi ike.