YouVersion Logo
Search Icon

MAK 16

16
1Mb͕e ubọchi-izu-ike gasiri, Meri Magdalini, na Meri nne James, na Salomi, we zuta uda utọ di iche iche, ka ha we bia te Ya manu. 2N'isi-ututu n'ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa, ha we bia rue ílì-Ya mb͕e anyanwu wara. 3Ha we sirita onwe-ha, Ònye gākpọrepuru ayi nkume ahu n'ọnu-uzọ ílì? 4Mb͕e ha lere anya n'elu, ha we hu na akpọreghachiwo nkume ahu: n'ihi na o riri nne nke-uku. 5Ha we ba n'ílì, hu nwa-okorọbia ka ọ nọduru n'aka-nri, b͕okwasi kwa uwe-nwuda ọcha; ibobo we nwua ha n'aru nke-uku. 6Ma ọ si ha, Ka ibobo ghara inwu unu n'aru nke-uku: unu nāchọ Jisus, Onye Nazaret, Onye akpọgideworo n'obe: emere ka O si n'ọnwu bilie; Ọ nọghi n'ebe a: le, ebe ha tọb͕ọrọ Ya! 7Kama labanu, si ndi nēso uzọ-Ya na Pita, O buru unu uzọ ga Galili: n'ebe ahu ka unu gāhu Ya, dika Ọ gwara unu. 8Ha we pua, si n'ílì ahu b͕alaga; n'ihi na ọma-jijiji na njubiga-anya-ókè nānwu ha n'aru: ha agwaghi kwa onye ọ bula ihe ọ bula; n'ihi na ha nātu egwu.
9Ma mb͕e O siri n'ọnwu bilie n'ututu n'ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa, O buru uzọ were Onwe-ya gosi Meri Magdalini, onye Ọ chupururi mọ ọjọ asa nime ya. 10Nwanyi ahu we ga kọrọ ndi Ya na ha nọri, mb͕e ha nēru újú nākwa kwa ákwá. 11Ma mb͕e ndi ahu nuru na Ọ di ndu, na ya onwe-ya hu-kwa-ra Ya-ri, ha ekweghi.
12Ma mb͕e ihe ndia gasiri emere ka Ọ puta ìhè nye madu abua nime ha n'udi di iche, mb͕e ha nēje ije, nāga n'azu obodo. 13Ndi ahu we je kọrọ ndi fọduru: ha ekweghi kwa okwu-ha.
14Emesia emere ka Ọ puta ìhè nye ndi-ozi iri na otù onwe-ha mb͕e ha nọduru na nri; O we ta ekweghi-ekwe-ha na obi-etili-ha uta, n'ihi na ha ekweghi okwu ndi huru Ya mb͕e emesiri ka O si n'ọnwu bilie. 15O we si ha, Ganu n'uwa nile, kwusara ihe nile ekère èkè ozi ọma nkem. 16Onye nke kwere, nke eme-kwa-ra ya baptism, agāzọputa ya; ma agāma onye nke nēkweghi ikpé. 17Ihe-iriba-ama ndia gēso kwa ndi kwere: n'aham ka ha gāchupu ndi-mọ ọjọ; ha gēkwu okwu n'asusu ọhu di iche iche; 18ha gāchilite agwọ, ọ buru kwa na ha aṅua ihe ọ bula nēbute ọnwu, ọ gaghi emeru ha aru ma-ọli; ha gēbikwasi ndi-nriaria aka, agēme kwa ka aru-ha di ike.
19Ya mere, otú a, mb͕e Ọ gwasiri ha okwu, ewe kuru Onye-nwe-ayi Jisus rigo n'elu-igwe, O we nọdu n'aka-nri nke Chineke. 20Ndi ahu we pua, kwusa ebe nile, Onye-nwe-ayi nēso kwa ha n'ilu ọlu, nēme okwu-ha ka o guzosie ike site n'ihe-iriba-ama di iche iche nke nēso. Amen.

Currently Selected:

MAK 16: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy