YouVersion Logo
Search Icon

LUK 2

2
1Ma o rue na mb͕e ahu, iwu si n'ebe Sisa Ọgọstọs nọ puta na agēde aha madu nile bi n'elu-uwa dum madu bi n'akwukwo. 2Nka bu odide-aha mbu edere mb͕e Kwiriniọs bu onye nāchi Siria. 3Madu nile we ga ka ede aha-ha n'akwukwọ, onye ọ bula ọ ga obodo nke aka ya. 4Josef we si kwa na Galili, site n'obodo Nazaret, rigo na Judia, ba n'obodo Devid nke anākpọ Betlehem, n'ihi na o si n'ulo na agburu Devid puta; 5ka o we me ka ede aha ya na Meri n'akwukwọ, bú nwanyi ekwere na ọ gālu, onye di kwa ime. 6O we rue, mb͕e ha nọ n'ebe ahu, ubọchi-ya zuru ka ọ gāmuta nwa. 7O we muta Nwa-nwoke mbu ya; o we ke Ya n'ákwà ọkiké, nyibe Ya n'ihe anētiye nri anu-ulo, n'ihi na uzọ adighi nye ha n'ulo ndi-ije.
8Ndi-ọzùzù-aturu di n'otù ala ahu nānọ n'ọhia, nēche kwa ìgwè aturu-ha n'abali. 9Mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi we guzo ha nso, ebube nke Onye-nwe-ayi muba-kwa-ra ha gburugburu: ha we tua egwu nke-uku. 10Mọ-ozi ahu we si ha, Unu atula egwu; n'ihi na le, anamezì unu ozi ọma nke oké ọṅù nke gādiri ndi Israel nile: 11n'ihi na ta n'obodo Devid ka amuru nye unu Onye-nzọputa, Nke bu Kraist Onye-nwe-ayi. 12Nka gābu-kwa-ra unu ihe-iriba-ama-Ya; Unu gāhu Nwa ọhu ekere n'ákwà ọkiké, nēdina kwa n'ihe anētiye nri anu-ulo. 13Na mberede ìgwè usu ndi-mọ-ozi nke elu-igwe we nọyere mọ-ozi ahu, nēto Chineke, si,
14Otuto diri Chineke n'ebe kachasi ihe nile elu,
Udo di kwa n'elu uwa n'etiti madu ndi ihe-ha di Ya ezi nma.
15O we rue, mb͕e ndi-mọ-ozi puru n'ebe ha nọ la n'elu-igwe, ndi-ọzùzù-aturu we sirita onwe-ha, Ka ayi je rue Betlehem ub͕u a, hu ihe a ekwuru, nke Onye-nwe-ayi mere ka ayi mara. 16Ha we were ọsọ bia, hu Meri na Josef, na Nwa ọhu ahu ka O dinara n'ihe ahu anētiye nri anu-ulo. 17Ma mb͕e ha huru ya, ha me ka amara okwu agwara ha-ri bayere Nwatakiri ahu. 18Okwu ndi-ọzùzù-aturu gwara ha we ju ndi nile nuru ha anya. 19Ma Meri debere ihe ndia nile ekwuru, nātughari ha n'obi-ya. 20Ndi-ọzùzù-aturu we laghachi, nēnye Chineke otuto, nēto kwa Ya n'ihi ihe nile ha nuru na nke ha huru, dika agwara ha.
21Mb͕e ubọchi asatọ zuru ibì Ya úgwù, ewe kpọ aha-Ya Jisus, nke mọ-ozi kpọrọ ya mb͕e akātughi ime Ya.
22Mb͕e ubọchi nile nke ime ha ka ha di ọcha dika iwu nke Moses si di zuru, ha we kuru Ya rigoro Jerusalem, iche Ya n'iru Onye-nwe-ayi 23(dika edeworo ya n'iwu Onye-nwe-ayi, Nwa mbu ọ bula nke bu oke nke meghere àkpà-nwa, agākpọ ya ihe nsọ nye Onye-nwe-ayi), 24na inye ihe-ichu-àjà dika okwu ekwuworo n'iwu Onye-nwe-ayi si di, Nduru abua, ma-ọbu umu-kpalakwukwu abua. 25Ma le, otù nwoke nọ na Jerusalem, onye aha-ya bu Simeon; nwoke a bu kwa onye ezi omume na onye nātu egwu Chineke, nēche nkasi-obi nke Israel: Mọ Nsọ di kwa n'aru ya. 26Mọ Nsọ duru ya-ri ọdu, na ọ gaghi-ahu ọnwu, rue mb͕e ọ gāhu Kraist nke Onye-nwe-ayi. 27O we bia na Mọ ahu nime ulo uku Chineke: mb͕e ndi muru Ya kubatara Nwatakiri ahu, bú Jisus, ka ha we mere Ya dika omume iwu Chineke si di, 28ya onwe-ya we nara Ya nke-ọma, kuru Ya n'aka-ya, gọzi kwa Chineke, si,
29Onye-nwem, ub͕u a ka I gārapu orù-Gi ka ọ la
N'udo, dika okwu-Gi si di;
30N'ihi na anyam ahuwo nzọputa-Gi,
31Nke I doziri n'iru ndi nile;
32Ìhè agēkpughere mba nile ọzọ,
Na ebube ndi-Gi, bú Israel.
33Ihe ekwuru bayere Ya we nēju kwa nna-Ya na nne-Ya anya; 34Simeon we gọzie ha, si kwa Meri nne-Ya, Le, edowo Nwa nka ka Ọ buru ọdida na nbili nke ọtutu madu n'Israel; ka Ọ buru kwa ihe-iriba-ama anēkwu okwu megide; 35ma mma-agha gāduwa kwa nkpuru-obi gi onwe-gi; ka ewe kpughe èchìchè nke si n'ọtutu obi puta. 36Otù onye anākpọ Ana di kwa, bú onye-amuma-nwanyi, nwa-nwanyi Fanuel, nke si n'ebo Asha puta (nwanyi a aghọwo ezi agadi, ebe ya na di-ya biri arọ asa site na nwa-ab͕ọghọ-ya, 37o we nọdu n'ọnọdu nwanyi di-ya nwuru rue ọgu arọ anọ na anọ), onye nāpughi n'ulo Chineke, ma o were obubu-ọnu na aririọ nēkpere Chineke abali na ehihie. 38O we bia rue ebe ahu n'otù oge hour ahu, we kele Chineke, gwa kwa ndi nile nēche nb͕aputa nke Jerusalem okwu bayere Ya. 39Mb͕e ha mezuru ihe nile nke di ka iwu Onye-nwe-ayi si di, ha we laghachi na Galili, rue obodo nke aka ha, bú Nazaret.
40Nwatakiri ahu we nētó, nēsi kwa ike, nējuputa n'amam-ihe: amara Chineke di kwa n'aru Ya.
41Ndi muru Ya nēje Jerusalem kwa-arọ n'ememe ngabiga. 42Mb͕e Ọ b͕ara arọ iri na abua, ha we rigo dika omume nke ememe ahu si di; 43mb͕e ha nọzuru ubọchi nile, mb͕e ha nālaghachi, Nwa-okoro ahu, bú Jisus, we nọdu n'azu na Jerusalem; ndi muru Ya amaghi kwa ya; 44ma ebe ha chère na Ọ di n'usu-ha, ha jere ije otù ubọchi; ha nachọ kwa Ya n'etiti ndi-ikwu-ha na ndi ha mara: 45mb͕e ha nāchọtaghi Ya, ha we laghachi na Jerusalem, nāchọ Ya. 46Ọ we rue, mb͕e ubọchi atọ gasiri, ha hu Ya n'ulo Chineke, ka Ọ nọduru n'etiti ndi-ozizí, nānu okwu-ha, nāju kwa ha ajuju: 47ibobo nghọta-Ya na ọziza nile Ya we nwua ndi nile nuru okwu-Ya n'aru. 48Mb͕e ha huru Ya, egwu wee tua ha n'aru: nne-Ya we si Ya, Nwam, Gini mere I meso ayi otú a? le, nna-Gi na mu onwem nāchọ Gi n'obi ufu. 49O we si ha, Gini mere unu nāchọm? ùnu amataghi na aghaghm idi n'ihe nke Nnam? 50Ma ha onwe-ha aghọtaghi okwu Ọ gwara ha. 51O we so ha rida, bia rue Nazaret; Ọ we nọdu n'okpuru ha: nne-Ya we nēdebe ihe nile ekwuru n'obi-ya.
52Jisus we nāga n'iru n'amam-ihe na ogologo, nāga kwa n'amara n'ebe Chineke na madu nọ.

Currently Selected:

LUK 2: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy