YouVersion Logo
Search Icon

JOSHUA 13

13
1Ma Joshua ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ya nāgwu; Jehova we si ya, I ghọwo agadi, ubọchi ndu-gi nāgwu, ma ala nke riri nne nke-uku fọduru inweta. 2Nka bu ala nke fọduru: buruburu-ala nile nke ndi Filistia, na ndi Geshua nile; 3site na Shaihoa ahu, nke di n'iru Ijipt, we rue ókè-ala Ekron n'akuku Ugwu, ndi Kenean ka aguru ya nye: ndi-isi ise nke ndi Filistia; ndi Geza, na ndi Ashdod, na ndi Ashkelon, na ndi Gat, na ndi Ekron; ndi Avim kwa, 4site na Ndida: ala nile nke ndi Kenean, na Meara nke ndi Zaidon nwe, rue Efek, rue ókè-ala ndi-Amorait: 5na ala ndi Gebal, na Lebanon nile, n'ọwuwa-anyanwu, site na Beal-gad n'okpuru ugwu Heamon rue nbata Hemat: 6ndi nile bi n'ugwu site na Lebanon rue Mizrefot-maim, bú ndi Zaidon nile; Mu onwem nānapu ha ala-ha n'iru umu Israel: nání me ka ọ dayere Israel n'ihe-nketa, dika M'nyeworo gi iwu. 7Ma ub͕u a kère ebo iteghete na nkera ebo Manase ala nka n'ihe-nketa. 8Ndi Reuben na ndi Gad soro ya nara ihe-nketa-ha, nke Moses nyere ha, n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, dika Moses, bú orù Jehova, nyere ha; 9site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na obodo nke di n'etiti ndagwurugwu ahu, na ala di lari nile nke Medeba rue Dibon; 10na obodo nile nke Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye buri eze nime Heshbon, rue ókè-ala umu Amon; 11na Gilead, na ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na ugwu Heamon nile, na Beshan nile rue Saleka; 12ala-eze nile nke Og nime Beshan, onye buri eze n'Ashtarot na n'Edrei (onye ahu fọduru site na ndi fọduru nke Refaim); Moses we tib͕ue ha, napu ha ala-ha. 13Ma umu Israel anapughi ndi Geshua na ndi Meakat ala-ha: Geshua na Meakat we biri n'etiti umu Israel, rue ta. 14Nání ebo Livai ka ọ nēnyeghi ihe-nketa; àjà-ọku nile nke Jehova, bú Chineke Israel, nke ahu bu ihe-nketa-ya, dika Ọ gwara ya okwu.
15Moses we nye ebo umu Reuben dika ab͕uru nile ha si di. 16Ókè-ala ha nwere we di site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na obodo nke di n'etiti ndagwurugwu ahu, na ala di lari nile nke di n'akuku Medeba; 17Heshbon, na obodo-ya nile nke di n'ala di lari; Dibon, na Bamot-beal, na Bet-beal-meon; 18na Jehaz, na Kedimot, na Mefaat; 19na Kiriataim, na Sibma, na Zeret-shaha n'ugwu ndagwurugwu ahu; 20na Bet-peoa, na nkpọrube nile nke Pisga, na Bet-jeshimot; 21na obodo nile nke ala di lari, na ala-eze nile nke Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye buri eze nime Heshbon, onye Moses tib͕uru, ya na ndi-isi Midian, bú Evi, na Rekem, na Zua, na Hua, na Reba, ndi bu ndi-isi nke Saihon, ndi bi n'ala ahu. 22Umu Israel were kwa mma-agha b͕ue Belam nwa Beoa, bu onye nāju ase, n'etiti ndi ha b͕uru. 23Òkè-ala umu Reuben we buru Jọdan, na ókè-ala-ya. Nka bu ihe-nketa umu Reuben dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà nile ha.
24Moses we nye ebo Gad, bú umu Gad, dika ab͕uru nile ha si di. 25Ókè-ala-ha we buru Jeza, na obodo nile nke Gilead, na nkera ala umu Amon, rue Aroea nke di n'iru Raba; 26site kwa na Heshbon rue Remat-mizpe, na Betonim; site kwa na Mahanaim rue ókè-ala Debia; 27na nime ndagwurugwu ahu, Bet-heram, na Bet-nimra, na Sukot, na Zafon, bú nke fọduru nke ala-eze Saihon, bú eze Heshbon, Jọdan na ókè-ala-ya, rue nsọtu oké osimiri Kineret n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu. 28Nka bu ihe-nketa umu Gad dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà nile ha.
29Moses we nye nkera ebo Manase ihe-nketa: ọ we diri nkera ebo umu Manase dika ab͕uru nile ha si di. 30Ókè-ala-ya we di site na Mahanaim, Beshan nile, ala-eze nile nke Og, bú eze Beshan, na ebe-obibi nile nke Jaia, nke di na Beshan, ọgu obodo atọ: 31nkera Gilead, na Ashtarot, na Edrei, bú obodo ala-eze Og nime Beshan, we diri umu Makia nwa Manase, diri nkera umu Makia dika ab͕uru nile ha si di.
32Ndia bu ndi Moses mere ka ha keta ihe n'ala ihe nādighi nke Moab, n'ofè Jọdan n'akuku Jeriko, n'akuku ọwuwa-anyanwu. 33Ma Moses enyeghi ebo Livai ihe-nketa: Jehova, bú Chineke Israel, bu ihe-nketa-ha, dika Ọ gwara ha okwu.

Currently Selected:

JOSHUA 13: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy